Ndọndọ Ukuu Ahụ

24/42

Isi Nke 23—Ozi Mụọ-ozi Nke Mbụ Ahụ

Ahụrụ m na Chineke nọọrọ n’ime nkwupụta nke oge ahụ na 1843. Ọ bụụrụ ọchịchọ ya ikpote ndị madụ, ma kpọrọ ha biarue ọnọdụ nwale ebe ha g’enwe nkpebi. Ndị n’eje ozi nwetara ojuju afọ ma kwenye kwa izi-ezi nke ọnọdụ e nyere oge amụma ndịa, na ha rapụrụ nganga ha, ụgwọ ọnwa ha, na nzukọ ha dị iche-iche, iga-n’iru site n’otu ebe rue ebe ọzọ n’ekwusa ozi ahụ. Ma dịka ozi ahụ nke sitere n’eluigwe pụrụ iwere ọnọdụ n’obi naanị nkpụrụ madụ ole na ole kpọrọ onwe ha ndị n’ejere Kraist ozi, e bọkwasịrị ọlụ ahụ n’isi ọtụtụ n’abụghị ndị ozizi. Ụfọdụ rapụrụ ọlụ-aka ha ikwusa ozi ahụ, ebe akpọkwara ndị-ọzọ site n’ụlọ-ahia ha dị iche-iche. Ọbụna ụfọdụ ndị ọkachamara ka a rụgịdere irapụ ọlụ-aka ha ma tinye aka n’ime ọlụ mbụ ahụ. Ndị n’eje ozi tọgbọrọ amamihe nke ọzụzụ ha na nchekube ha, ma jikọta aka n’otu ikwusa ọbịbịa nke Jisọs. A kwaliri ndị madụ ebe ọbụla ozi a ruru ha. Ndị nmehie chegharịrị, kwaa akwa ma kpeekwa ekpere n’ihi ngbaghara nmehie, ma ndị niile a matara dịka ndị n’ebi ndụ aghụghọ, nwetara ọnụ-ọkụ n’obi ikwụghachi ihe ndị ha nwetara n’ụzọ n’adịghị mma. NUA 138.1

Ndị nne na nna nwetara nmetụta dị omimi banyere ọdị-mma nke ụmụ ha. Ndị niile natara ozi ahụ, lụrụ ọlụ n’ebe ndị enyi na ndị arụ ha na ak’echegharịghị nọ, ma dịka ibu-arụ nke nkpụrụ-obi site na ozi ahụ dị nro, ha dọsịrị ha aka na ntị ike n’arịọkwasị ha ka ha jikere n’ihi ọbịbịa Nwa nke madụ. Ndịa bụ ndị sikarịrị ike na adịghị e kwenyere oke ihe ngosi dị otua e mere ka o rute ha site n’idọ aka na ntị ndịa dị nkpa. Ọlụ-nsacha nkpụrụ-obi a wezugara nmasị n’ihe nke ụwà, rue n’odịdo nsọ nke n’ahụghị ọdịdị ya mbu. Nnụkuru nnụ madụ ka e duru ị mara ezi-okwu ahụ nke William Miller kwusara, a kpọlietekwara ọtụtụ ndị otu nke Chineke na mụọ na ike nke Elaija ikwusa ozi ahụ. Ndị niile kwusara ozi a dị nro dịka Jọn onye o dozi ụzọ nke Jisọs, ka a rụgịdere itinye anyụ-ike na nkpọrọgwụ nke osisi, ma kpokue ụmụ madụ ka ha mịpụta ezi-nkpụrụ dịrị nchegharị. Ọgbụgba-àmà ha ka a haziri ịkpali na inwe nhuku sịrị-ike na nzukọ dị iche-iche, ma gosipụtakwa agwa ha ka o si dị. Ma dịka ha n’eti nkpu nke ịdọ aka na ntị ahụ dị nro ka a gbanarị iwe ahụ nke gaje ịbịa, ọtụtụ ndị jikọrọ-aka na nzukọ ndịa natara ozi nke ọgwụgwọ nsọ ahụ; ha hụtara ndala-azụ ha dị iche-iche, ma, sitekwa n’anya-miri dị-ilu nke nchegharị, na iri-uju nke obi, wedata onwe ha àlà n’iru Chineke. Ma dịka Mụo-nsọ Chineke dakwasirị ha, ha nyere aka n’iti-mkpu ahụ, Tụa egwu Chineke, ma nyekwa ya otuto, n’ihi na oge-awa nke ikpe Ya abiawo. NUA 138.2

Nkwusa banyere otu oge were anya kpatara nmegịde site n’akụkụ niile nke ndị madụ, site na ndị n’eje ozi n’isi-oche, rue n’aka ndị nmehie anya-ike, na ndị n’atu eluigwe aka n’iru. Ọdịghị madụ matara ụbọchị na awa ahụ, nka bụ naanị ihe a na anị site n’ọnụ onye ozi iru-abụa na n’ọnụ ndị njakịrị anya-ike. Ụdị madụ ndịa abụghị ndị a pụrụ ịkuzi ihe ma dozie kwa ha olu ụzọ e si e were okwu ndịa mee ihe site n’aka ndị ahụ n’atu aka afọ mgbe ha kweyere na oge amụma ndịa g’agabiga, na ihe iribama niile gosịrị ịdị nso nke Kraist, ọbụna n’ọnụ ụzọ. Ọtụtụ ndị ọzụzụ igwe-atụrụ, ndị n’asị na ha hụrụ Jisọs n’anya, kwuru na ha adịghị emegịde nkwusa nke ọbịbịa Kraist; kama ha ekwenyeghị na nmawapụta nke oge ya. Anya Chineke nke n’ahụzu ihe niile nyochara àlà-àlà obi ha. Ha ahụghị Jisọs n’anya m’ọli. Ha matara na ndu e kweghị-ekwe ha a pụghị inagịde nwale a; n’ihi na ha a dịghị eje ije n’ụzọ nweda àlà nke ya onwe ya tụrụ nto-àlà ya. Ndị ọzụzụ-atụrụ ụgha ndịa nọchiri n’ụzọ nke ọlụ nke Chineke. Ezi-okwu ahụ nke e kwupụtara n’ike nye ndị madụ kwaliri ha, ma dịka onye isi ụlọ-nkpọrọ ahụ, ha malitere iju si; Gịni ka m g’eme ka e we zọpụta m? Kama ndị ọzụzụ-atụrụ ndịa batara n’etiti ezi-okwu ahụ na ndị madụ, ma n’ekwusakwa okwu ire-ụtọ ha dị iche-iche iduru ha pụa n’ezi okwu ahụ; ha jikọrọ-aka n’otu ha na Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya, n’etikwa, udo, udo, mgbe udo n’adịghị. A hụrụ m na ndị mụọ-ozi nke Chineke ribara àmà ihe ndịa niile na ihe ngbokwasị ndị ọzụzụ atụrụ ndịa n’edoghị nsọ ka e kpuchiri site n’ọbara ọtụtụ nkpụrụ obi. Ndị niile hụrụ ahụ-udo n’anya, nwekwa ojuju afọ n’ime ọnọdụ ha dị anya n’ebe Chineke nọ, agaghị enweta nkwali site na nchekwa ndụ nke anụ-arụ ha. NUA 139.1

Ọtụtụ ndị na eje ozi agaghị a nara ozi nzọpụta nka n’onwe ha, ma ndị niile g’anara ya, ka ha na egbochikwa. Ọbara nke ọtụtụ nkpụrụ-obi dị n’isi ha. Ndị ozizi na ndị madụ ọzọ ha jikọrọ aka imegịde ozi a si n’eluigwe. Ha kpagburu William Miller, na ndị niile ya na ha jikọrọ-aka n’ọlụ ahụ. Okwu-ụgha dị iche-iche ka a gbasara iji mebie nhuku ya, ma n’oge dị iche-iche mgbe o kwupụtasịrị okwu ndụmọdụ Chineke, n’ụzọ were anya, n’etinye ezi-okwu ndịa n’adụwà adụwà n’obi ndị n’ege ya ntị, oke iwe ka a kpasuru megide ya, ma dịka ọ rapụrụ ogịge ọgbakọ ahụ, ụfọdụ na echere ya n’ụzọ iwepụ ndụ ya. Kama ndị mụọ-ozi nke Chineke ka e zigara ichekwa ndụ ya, ha n’edurukwa ya n’udo pụa n’etiti igwe madụ ahụ n’eme ọgb’aghara n’iwe. N’ihi na ọlụ ya a kagwụghị. NUA 141.1

Ndị sịrị ike n’okwukwe ji obi-ụtọ nara ozi ahụ; ha matara na o sitere na Chineke, na e nyekwara ya n’oge kwesịrị ekwesi. Ndị mụọ-ozi jikwa nmasị dị omimi n’ele nlụpụta nke ozi eluigwe ahụ, ma mgbe nzukọ dị iche-iche chigharịrị ma jụkwa ya, ha sitekwara n’obi-ilu wee kọsara Jisọs. Ọ tụgharịrị iru ya site n’ebe nzukọ ndịa nọ, ma gwa ndị mụọ-ozi ya ka ha nọgịde na nche n’ebe nkpụrụ-obi ndịa dị nkpa nọ bụ ndị n’ajughị ezi-àmà ahụ, n’ihi na ihè ọzọ ga amụnyekwara ha. NUA 141.2

A hụrụ m na ọbụrụ na ndị sị na ha bụ ndị nke Kraist hụrụ ọbịbịa nke Onye-nzọpụta ha n’anya, ọ bụrụkwa na ha tụkwasịrị ya obi ha, ọ bụrukwa na o metụrụ ha n’uche na ọ dịghị onye ọbụla n’elu ụwà a pụrụ iji tụnyere ya, ha ka e jiwo ri ọñụ nara ozi mbụ ha nụrụ banyere ọbịbịa ya. Kama e nweghị-nmasị nke ha gosipụtara, mgbe ha nụrụ banyere ọbịbịa nke Onyenwe ha, bụ ihe ngosi were anya na ha a hụghị ya nanya. Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya ñụrịrị, ma tụa kwa ya n’iru Jisọs Kraist na ndị mụọ-ozi ya dị nsọ, na ndị sị na ha bụ ndị nke ya ahụghị Jisọs n’anya nke ha ikwe na ọbịbịa ya nke ugbo abụa. NUA 142.1

A hụrụ m ndị nke Chineke, n’ọñụ n’ime olileanya, n’echere Onyenwe ha. Ma Chineke chọrọ inwapụta ha. Aka ya kpuchiri nmejọ-ihe nke emere na ngbakọ nke oge amụma ha. Ndị niile n’ele anya onyenwe ha a chọpụtaghị ya, ọbụna ndị ọka-nmụta ndị kwuru megide oge ahụ e letaghịkwa nmejọ ihe ahụ. Chineke kwere ka ọ dị otua na ndị ya g’ezute nkpọchụ-iru. Oge ahụ gafere, ma ndị niile nwere ọñụ n’echere onye-nzọpụta ha nwetara obi-ilu na ida-mba, mgbe ndị ahụ n’ahụghị ọbịbịa Jisọs n’anya, kama nakwere ozi ahụ site n’ụjọ, nwere obi-ụtọ na ọ biaghị n’oge ahụ e lere anya ya. Nkwenye ha e metutaghị obi ha ma mee ka ndụ ha dị ọcha. A gbakọrọ oge ahụ n’agafe nke ọma ka-ekpuhee ụdi obi ndịa. Ọ bụkwa ha bụ ndị mbụ tụgharịrị ime ndịa nwere nkpọchụ-iru na eri-uju ihe ọchị, bụ ndị hụrụ ọbịbịa nke onye-nzọpụta ha n’anya n’ezie. A hụrụ m amamihe nke Chineke n’inwapụta ndị nke ya, na enyekwa ha nnyocha na nwale ichọpụta ndị g’ada ma laghachikwa azụ n’oge nke ọnwụnwa. NUA 142.2

Jisọs na ụsụụ ndị eluigwe niile ji obi-ahizi na ihụnanya legịde ndị ahụ jiri obi-ụtọ chere ihụ ya bụ onye nkpụrụ obi ha hụrụ n’anya. Ndị mụọ-ozi na erụgharikwa gburu-gburu ha, ịgba ha ume n’oge nke ọnwụnwa ha. Ndị niile juworo inara ozi nke eluigwe ahụ ka a rapụrụ n’ọchịchịri, ma iwe nke Chineke bilikwara megide ha, n’ihi na ha a naraghị ihe o ziteere ha site n’eluigwe. Ndị ahụ kwesịrị ntụkwasi-obi, nwetakwara nkpọchụ-iru ahụ, ndị na aghọtaghịkwa ihe mere Onyenwe ha abiaghị, a rapụghịkwa ha n’ọchịchịri. E dukwara ha ọzọ laghachi n’akwụkwọ-nsọ ha inyochakwa oge amụma ndịa. E wepụrụ aka nke Onyenwe-anyị site n’ihe ngbako ndịa, e we kọwa nmejọ ihe ahụ. Ha hụrụ na oge nke amụma ahụ rutere na 1844, na ọbụna otu ihe ngosipụta ahụ nke ha wepụtaworo iji gosi na oge amụma ndịa mechiri na 1843, gosikwara na ha g’akwusị na 1844. Ihè nke sitere n’okwu Chineke mụnyere n’ọnọdụ ha, ha wee chọpụta kwa oge nke nchere. - Ọ bụrụ na ọhụụ ahụ n’anọ ọdụ, chere ya. N’ime ihụnanya ha banyere ọbịbịa Jisọs n’oge ahụ, e legharawo ha nchere-oge nke ọhụụ ahụ anya nke a gụkọrọ iji mee ka ndị n’ele anya ya n’ezie pụta ihe. Ọzọkwa ha nweworo oge a hụrụ mma. Ma a hụru m na ọtụtụ n’ime ha e tofeghị oke nkpọchụ-iru ha inweta ụdị ọnụ-oku nke obi na ike ahụ nke e ji mara okwukwe ha na 1843. NUA 143.1

Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya ñụrịrị ọñụ nmeri, ma ndị ahụ kwa bụ ndị na a naraghị ozi ahụ, jara onwe ha n’ihi nleru-anya ha dị ukuu na amamihe ha na a nakwereghị nduhie ahụ, dịka ha kpọrọ ya. Ha a mataghị na ọ bụ ndụmọdụ nke Chineke ka ha n’ajụ megide onwe ha, na ha n’alụkọ ọlụ n’otu ha na Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya ime ka ndị nke Chineke nwe mgbagwoju-anya bụ ndị n’ebi ndụ n’ime ozi nke sitere n’eluigwe. NUA 144.1

Ndị kwere n’ozi a nwetara nkpagbu n’ime nzukọ. Ụjọ jidere ha na nwoge, nke mere ha alụghịkwa ọlụ nke obi rụtụrụ ha ịlụ, kama ngafe nke oge kpuhere nzube niile nke obi ha. Ha chọrọ ikpuchi àmà ahụ nke ndị kwere-ekwe nwere nrụgịde ikwusa, na oge nke amụma ahụ rutere 1844. N’ụzọ were anya ha kọwara nmejọ ihe ha, ma nyekwa nkọwa ihe mere ha jiri lee anya onye nwe ha na 1844. Ndị nkwugịde a pụghịkwa iweta osi-agụgọ ọbụla ọzọ megide nkọwa ndịa dị ike e nyere. Iwe nke nzukọ bilitere megide ha. Ha kpebiri ijụ ihe-ngosi ọbụla na imechibido àmà ha niile ọbụla na nzukọ, ka ndị ọzọ ghara inụ ya. Ndị niile n’agaghị arapụ inye ndị ọzọ ihè nke Chineke nyere ha, ka a chụpụrụ site na nzukọ; kama Jisọs nọyere ha, na ha nwere ọñụ n’ime ihè nke iru ya. Ha jikekwaara inara ozi mụọ-ozi nke abụa. NUA 144.2