Ndọndọ Ukuu Ahụ
Isi Nke 22—William Miller
Ahụrụ m na Chineke zigara mụọ-ozi ya ikwali obi nke otu onye ọlụ-ubi, onye n’adịghị mgbe o kweworo n’akwukswo nsọ, ma duru ya inyocha okwu amụma niile. Ndị mụọ-ozi Chineke nọgidere ileta onye ahụ a rọpụtara, n’edukwa uche obi ya, ma meghekwa nghọta ya banyere amụma niile nke gbara itiri nye ndị nke Chineke. Nmalite nke iyagba ezi-okwu niile ka e nyere ya, e wee durukwa ya inyocha site n’otu nkeji okwu rue na nkeji ọzọ, rue mgbe o letara ihe itu-n’anya na ịdị mma nke okwu Chineke. Ọ hụrụ n’ime ya nkò nke jikọtara ezi-okwu n’ozuzu-oke. Okwu ahụ nke ọ hụworo dịka ihe n’esiteghị rị na Chineke, bụ nke na- emeghepụ anya ya ugbua n’ima mma na ebube. Ọ hụrụ na otu nkega nke akwụkwọ-nsọ na akọwakwa nkega ọzọ, ọbụna mgbe otu nkega mechiri emechi nye nghọta ya, ọ chọpụtara ihe n’akowa ya na nkega ọzọ nke okwu ahụ. O wee nara okwu Chineke site n’ọñụ na nsọpụrụ dị omimi na itu-egwu. NUA 133.1
Ka ọ n’eso okwu amụma niile n’usoro usoro, o hụrụ na ndị bi n’ụwà n’adị ndụ ugbua n’oge ikpeazụ nke elu-ụwà, ma ha a mataghịkwa ya. O wee leba anya na nmetọ niile nke nzukọ dị iche-iche, wee hụ na ha e wezugawo ihụnanya ha n’ebe Jisọs nọ, ma tụkwasị ya n’elu ụwà, ha wee n’achọ nsọpụrụ nke ụwà karịa ichọ nsọpụrụ ahụ nke sitere n’elu bia; ọchịchọ nke akụ na ụba nke ụwà, kama ikpado akụ ha n’eluigwe. Ndụ iru-abụa, ọchịchịrị na ọnwụ ka ọ n’ahụ ebe niile. Ọnọdụa kpalirị mụọ ya nke ukuu. Chineke kpọrọ ya ka ọ rapụ ọlụ ubi ya, dịka a kpọrọ Elisha ka ọ rapụ ịnyịnya-ibu ya n’ogịge nke ọlụ ya isoro Elijah. N’itụ egwu, William Miller malitere ịtọghepụ ihe omimi niile nke àlà-eze nke Chineke nye ụmụ madụ o nwetara ike site n’ime mgbali ya ọbụla. Ọ n’ekuru ndị madụ sitekwa n’okwu amụma niile rue n’oge nke ọbịbịa abụa nke Kraist. Dịka Jọn Baptist kwusara ọbịbịa mbụ nke Jisọs, ma doziekwa ụzọ ọbịbịa ya, otua kwa ka William Miller na ndị niile sonyere ya, kwusara ọbịbịa-abụa nke Ọkpara Chineke. NUA 133.2
E kuuru m laghachi azụ rue n’oge nke ndị n’eso ụzọ Kraist, e wee gosi m Jọn onye a hụworo n’anya, na Chineke nwere ọlụ pụrụ-iche nye ya n’ọghaghị iluzu. Ekwensu gbalisịrị ike igbochi ọlụ a, ma durukwa ndị n’ejere ya ozi ịla Jọn n’iyi. Kama Chineke zigara mụọ-ozi Ya ma chekwa ya n’ụzọ dị ebube. Ndị niile hụrụ ike ukuu nke Chineke gosịrị na mgbapụta nke Jọn, tụrụ egwu, ọtụtụ madụ ka o wekwara anya na Chineke nọyere ya, na ọbụna àmà niile nke ọ gbara bayere Jisọs bụ ezi-okwu. Ndị ahụ niile chọworo ịla ndụ ya n’iyi tụrụ egwu iwepụ ndụ ya ọzọ, ma e kwere ka o nọgịde n’ịta ahụhụ n’ihi Jisọs. E boro ya ebubo-ụgha site n’aka ndị iro ya, ma n’oge n’eteghị anya chụba kwa ya n’agwa-etiti madụ n’adịghị, ebe Onyenwe-anyị zigara mụọ-ozi ya ka o kpugheere ya ihe ha ndị g’eme n’elu ụwà, na ọnọdụ nke nzukọ rue ọgwụgwụ; ọlịla-azụ ya, na ọnọdụ nke nzukọ g’anọ ma ọ bụrụ na ọ g’eme ihe dị Chineke ezi-mma, ma meriekwa n’ikpeazụ. Mụọ-ozi ahụ nke sitere n’eluigwe biakutere Jọn n’ịdị ukuu ya. Iru ya nwubigara oke site n’ebube nke eluigwe. O kpuheere Jọn ọnọdụ dị-omimi nke na akpalikwa mụọ banyere nzukọ nke Chineke, ma wetakwa n’iru ya nsogbu dị oke egwu nke ha g’anagịde. Jọn hụrụ ka ha gabigara oke ọnwụnwa dị iche-iche, ka a nụchakwara ha, ma bụrụkwa ndị meriri emeri n’ikpeazụ, ndị a zọpụtakwara baa n’ebube nke àlà-eze Chineke. Iru nke mụọ-ozi ahụ malitere igbu marà-márá n’ọñụ, n’enwebigakwa ebube oke, ka o n’egosi Jọn nmeri ikpeazụ nke nzukọ Chineke. E wezugara Jọn n’anụ-arụ mgbe o n’elegịde nnapụta ikeazụ nke nzukọ, ma dịka ebube nke ọnọdụa buuru ya, sitekwa na nsọpụrụ dị omimi na itu-egwu, o wee daa n’ụkwụ-àlà mụọ-ozi ahụ ife ya ofufe. Mụọ-ozi ahụ kulitere ya n’otu mgbe ahụ, n’adụkwa ya ọdụ n’olu dị nwayọ, sị e mela nka, n’ihi na mụ-onwem bụkwa oru ibe gị nke n’esitekwa n’ime ụmụnna gị ndị nwere àmà nke Jisọs; kpọ isi-àlà nye Chineke; n’ihi na àmà nke Jisọs bụ mụọ nke amụma. Mgbe ahụ mụọ-ozi ahụ gosịrị Jọn obodo nke eluigwe na ịdị-mma ya niile na igbu marà-márá nke ebube ya. Jọn pụrụ n’anụ-arụ n’ihe iju-anya nke sitere n’oke ebube nke obodo ahụ. O chetaghị kwa ndụmọdụ mbụ mụọ-ozi ahụ nyere kama ọ dara ọzọ ife ofufe n’ụkwụ-àlà mụọ-ozi ahụ, onye dụkwara ya ọdụ ọzọ, n’olu dị nwayọ, hụkwa na i meghị nka; n’ihi na a bụ m oru ibe gị nke sitekwara n’ime ụmụnna gị ndị amụma, na ndị ahụ n’edebe okwu niile nke akwụkwọa; kpọ isi-àlà nye Chineke gị. NUA 134.1
Ndị-ozizi na ọtụtụ ndị madụ n’eleta akwụkwọ nkpuhe dịka ihe n’adịghị aghọta-aghọta nke n’adịghịkwa mkpa karị nkega ndị ọzọ n’akwụkwọ nsọ. Kama a hụrụ m na akwụkwọ nka n’ezie bụ nkpuhe e kpuhere n’ezie ịba-uru n’ụzọ pụrụ iche nye ndị g’ebi ndụ n’oge ikpeazu, nduzi ha ka ha mara ọnọdụ ha, na ọlụ dịrị ha. Chineke duuru uche William Miller banye n’ime okwu amụma niile, ma nyekwa ya ihè dị ukuu n’akwụkwọ nkpuhe. NUA 136.1
Ọ bụrụ na a ghọtara ọhụụ niile nke Daniel, ndị madụ g’aghọtakwa ọhụụ nile nke Jọn nke ọma. Ma, n’oge kacha mma, Chineke kpaliri oru ya Ọ rọpụtara onye sitere nụzọ were anya na n’ike nke Mụo-nsọ, kpuhee amụma niile ndịa, ma gosikwa nkwekọrịta nke ọhụụ niile nke Daniel na nke Jọn, na nkega ọzọ niile nke akwụkwọ nsọ, ma kpọdata n’ime obi ụmụ madụ bụ okwu ndumọdụ niile ndịa dị nsọ dịkwa egwu, ime njikere n’ihi ọbịbịa nke nwa nke madụ. Ncheghari dị omimi dịkwa nro bara n’uche ndị niile nụrụ olu ya, ọbụna ndị-ozi, ndị nmehie na ndị na ekweghị ekwe, chigharikutere Onyenwe-anyị, n’ime nkwado iguzoro nụbọchị ikpe. NUA 136.2
Ndị mụọ-ozi nke Chineke soro William Miller n’ozi ya. O guzosịrị-ike n’enweghị obi-abụa. O zisara ozi e nyere ya n’aka n’atụghị egwu. Ụwà nke tọgbọrọ na nmebi-iwu, na nzukọ jupụtara n’ihe nke ụwà na ọjujur’oyi, bụ ihe ndị zuru oke ikpali ọlụ ya n’ike, na ị duru ya ị ji obi ya niile nagịde ọlụ a, na nhụju-anya ya niile. Ọ bụ ezie na ndị kpọrọ onwe ha ndị nke Kraist na ndị ụwà n’emegịde ya, tinyekwara nsogbu niile nke Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya, ma ọ kwụsighị ikwusa ozi-oma ebighị-ebi ahụ nye igwe-madụ dị iche-iche ebe ọbụla a kpọrọ ya, n’etikukwa mkpu ahụ, tụa-egwu Chineke ma nyekwa ya otuto; n’ihi na oge-awa nke ikpe Ya a biawo. NUA 137.1