Ndọndọ Ukuu Ahụ

1/42

Ndọndọ Ukuu Ahụ

Okwu Nmalite

Anyị dịrị iwu dịkwara ihe-àmà; ọbụrụ na ha adịghị ekwu dịka okwua si dị, n’ezie ọdịghị chi-ọbụbọ dịrị ha. Asaia 8:20 NUA 4.1

Ka ọ dị ugbua, na nmalite nke agba-oge iri abụa na otù, ọ dị ka madụ ọbụla aburuwo onye amụma. Ọbụna ọgba ibu-amụma dị iche-iche a dịwokwa na ozi-ikuku nke intanet. Ma ụfọdụ ha n’ekwu ihe dị iche-iche n’enweghị otu olu. Olee otu anyị ji à márá na ha bụ ndị ha n’ekwu na ha bụ, - ndị n’anatara Chineke okwu? Ọ bụ site n’itule ihe ha n’ekwu site n’iwu Chineke na ihe-àmà Ya. N’ezie otu Chineke ahụ nke nyere okwu nsọ Ya n’oge ndị gara-aga n’aka ndị madụ ma meekwa ka e dee ha n’akwụkwọ — bụ akwụkwọ niile nke baibul, agaghị emegịde onwe Ya! NUA 4.2

Jisọs bukwara amụma banyere nka, ebe Ọ matara na ihe banyere ibu-amụma g’abụ ihe nwale ukuu nye ndị oge ikpeazụ: “Ọtụtụ ndị-amụma ụgha g’ebilikwa, ha g’eduhiekwa ọtụtụ madụ” Matiu 24:11. N’imasị ọkwa nka ike, Chineke nyere Jọn okwu ndịa: “Ndị m hụrụ n’anya, unu ekwela okwu mụọ niile, kama nwapụta ndị mụọ ahụ ma ha bụ ndị siri na Chineke pụta: n’ihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha a pụwo baa n’ụwà” 1Jọn 4:1. N’ezie Ellen White abụghị onye a gụpụrụ na nka. Were akwụkwọ nka ma tulee ya site n’akwụkwọ nsọ; ọ gafere nwale ahụ mọbu na ọ gafeghị? Kpeekwa ekpere nye Nna-anyị onye ebere nke bi n’eluigwe, Ọ g’ezipụkwa Mụọ-nsọ Ya ka o duzie anyị n’ime ezi-okwu niile. NUA 4.3

O yiri ihe n’apụghị ikwere ugbua, kam’ọbụna rue afọ ole na ole n’oge ndị gara aga, imerime ndị kpọrọ onwe ha Ndị nke Kraist tara obi ha miri megide onye ọbula sị na ya nwetara nkpuhe site n’aka Chineke. Ngwa-ngwa ha n’agụrụ ya Nkpuhe 22:18-19 iji kwado nmegịde ha; “Mu onwem n’agbara onye ọbụla àmà bụ onye n’anụ okwu niile nke amụma nke akwụkwọ a, sị Ọ bụrụ na onye ọbụla g’atụkwasi okwu n’ihe ndịa, Chineke g’atukwasịrị ya ihe otiti niile nke e deworo n’akwụkwọ a: Ọ bụrụkwa na onye ọbula g’ewepụ okwu n’ime okwu niile nke akwụkwọ nke amụma nka, Chineke g’ewepu òkè ya pụa n’akwụkwọ nke ndụ ahụ, wepụkwa òkè ya, site n’obodo nsọ ahụ, na sitekwa nihe niile nke e deworo n’akwụkwọ nka.” NUA 5.1

Ma okwu nka ọ n’asi na ọbụna mgbe Jọn nwụsịrị, na ọ dịghịkwa ndị amụma ọzọ g’esite na Chineke bia? Ọ bụrụ otua, gịnị mere Jisọs n’asị anyị ‘kpachara anya n’ihi ndị amụma ụgha’? Gịnị mere Mụo-nsọ sitere n’aka Jọn n’asị ka anyị nwalee mụọ niile? Ọ bụ na ihe ndịa niile agaghị a dịrị anyị mfe ilepụ anya na ndị niile sị na ha nwere okwu site n’ebe Chineke nọ? Ma nka abụghị atụmatụ Chineke. Ọ n’enye ezi-okwu ọhụụ na mgbe ọbụla o kwesịrị, n’emekwa ka á márá ọchichọ Ya, ma onye ọbụla dị ọcha n’obi g’enyochkwa hụ na ọbu ezi-okwu, ma were ọñụ nara ya ma sọkwa ya. Ọ bụ ezie na Ekwensu g’enwekwa ohere ilụ ọlụ ya. Ọ bụrụ na e nyeghị ya ohere, ọ ga- ebọkwa Chineke ebubo dịka onye nmegbu. NUA 5.2

Mụọ-nsọ sitere n’aka Pọl n’ajụ ajụjụ ụfọdụ dị oke mkpa, ndị a n’elegharakwa anya mgbe niile, ajụjụ ndị nọ na 1Kọrint 12. Ọ g’abụ na ha niile bụ ndị-ozi? Ọ g’abụ na ha niile bụ ndị amụma? Ọ g’abụ na ha niile bụ ndị ọlụ nke ime ihe-iribàmà? Ọ g’abụ na ha niile nwere onyinye àmàrà nke ịgwọ ọria? Ọ g’abụ na ha niile ji asụsụ dị iche-iche ekwu okwu? O wee kwupụta na ya g’ezi anyị ụzọ nke “kachasị mma” n’asị na onyinye àmàrà ndịa a baghị uru ọbụla nye anyị m’ọbụrụ na anyị enweghị ịhụnanya. N’isi nke 14, ọ gakwara n’iru n’agwa anyị “N’agbaso nụ ihụnanya; otu ọdị, were nụ obi n’anụ-ọkụ chọ onyinye-amara niile nke Mụo-nsọ, ma n’achọkarị nụ ka unu bu amụma”. “Ya mere ụmụ-Nna m, were nụ obi n’anụ-ọkụ chọọ ka unu bu amụma, Unu egbochikwala iji asụsụ dị iche-iche ekwu okwu.” Unu emenyụla Mụo-nsọ; unu akpọla ibu-amụma ihe efu. N’anwa nụ ihe niile; jidesie nụ ihe-ọma ike.” Ndị 1Teslọnika 5:19-21. NUA 6.1

E nyere Ellen White ọhụụ nke “Ndọndọ Ukuu ahụ” n’etiti afọ 1858 n’obodo Lovetts Grove, Ohio, USA. Ọtụtụ n’ime ya ka ọ hụworo na ọhụụ afọ iri na otu gaworo aga, ma n’oge nka, a gwara ya ka o depụta ya n’agbanyeghị na Ekwensu g’agbasi mgba ike igbochi ya. Nkega ụfọdụ nke ọhụụ a, tụmadị nkega nke 30, ka e biri n’akwụkwọ n’afọ 1847 n’isi okwu “Igwe Atụrụ Nta” Ebikwara ya na 1851 n’isi okwu “Amamihe na echiche-obi ndị nke Kraist.” Na nke e bikwara na 1854 n’ọnọdụ akwụkwọ dị iche-iche. Ha niile sitere n’ike nke Mụọ-nsọ, nke e depụtakwara site n’aka nwanyị ahụ dị àlà, nke maara Chineke, ma bipụta ya nke mbụ n’afọ 1858. Ekwensu, onye gbalịrị ikpọchapụ akwụkwọ-nsọ n’elu ụwà, ma tụghariakwa site n’ịgbajupụta ụwà na ọtụtụ ndegharị dị iche-iche nke akwụkwọ-nsọ a, n’anọgịdesikwa ike n’ọlu ibibi na imerụ akwụkwọ nka kwa nke bụ akwụkwọ nke abụa dịkasị nkpa n’ụwà niile nye nwa Chineke ọbụla. Kama Chineke e chekwawo okwu Ya. NUA 6.2

Ọtụtụ ndị n’aju ajụjụ ihe mere nsogbu dị iche-iche jiri jupụta n’ụwà anyị; agha dị iche-iche, ime mpụ, na nmekorite rụrụ arụ niile, e ọbụna n’okpukperechi dị iche-iche. Ebe mgbakwasi-ụkwụ na ọziza nke ajụjụ ndịa ka a ga-chọta site n’ighọta ndọndọ ukuu ahụ dị n’etiti Kraist na Ekwensu nke nọ n’aga n’iru sitekwa na mgbe madụ ọbụla n’akadịghị. NUA 7.1

Ka Onyenwe-anyị wụsara gị onyinye kasị mma, gị onye n’agụ akwụkwọ a, ka ị n’achọ “inwapụta ihe niile” ndị e dere n’akwụkwọ nka site n’okwu nke Chineke — bụ akwụkwọ nsọ. NUA 7.2

Onye tụgharịrị akwụkwọa n’asụsụ igbo bụ nwanne anyị nwoke, Elder A.C. Nwankpa nke Adventist Men’s Ministry, Aba, Nigeria NUA 8.1