Ndọndọ Ukuu Ahụ

2/42

Isi Nke 1—Ọdịda Nke Ekwensu

Onyenwe-anyị egosiwo m na Ekwensu bụụrụ mụọ-ozi e nyere ùgwù n’ eluigwe, onye n’ esoje Jisọs Kraist. Iru Ya dịịrị nwayọọ, n’igosi obi-ụtọ dịka ndị mụọ ozi ọzọ. Egedege iru ya dịịrị elu dịkwa obosàrà ma gosikwa oke akọ-n’uche. Ọdịdị ya zuru oke. O nwekwara ụdị nke onye á mààrà ahà ya, dịkwa elu nke ukuu. A hụkwara m na mgbe Chineke sịrị Ọkpara Ya, bia ka Anyị kee madụ n’oyiyi Anyị, Ekwensu nweworo ekworo n’ebe Jisọs nọ. Ọ chọworo ka a kpọtụrụ ya banyere okike madụ. O jupụtara n’anya-uku, ekworo na ikpọ-asi. Ọ chọrọ ibụ onye kachasi elu n’eluigwe, n’esoje Chineke ka ọ nara ùgwù kachasi elu. Tutu oge nka, eluigwe niile dịịrị n’usoro, na izu oke nke ịdị n’okpuru ọchịchị nke Chineke. NUA 9.1

Ọ bụ nmehie dịkasịrị elu bụ inupu-isi megide usoro na uche nke Chineke. Eluigwe niile dịka ọ nọ n’ọgbaghara. A mawapụtara ndị mụọ-ozi n’ụsụụ ha dị iche-iche nke ụsụụ ọbula nwekwara mụọ-ozi n’edu-edu. Mụọ-ozi ndịa niile ka a kpaliri. Ekwensu nọkwa n’arọgịde ọchịchị nke Chineke, n’ọchịchọ nke ibuli onwe ya elu, n’achọghịkwa irudatara ikike nke Jisọs. Ụfọdụ ndị mụọ-ozi nọyeere Ekwensu na nnupu-isi ya, ma ndị ọzọ nọsịrị ike na nkwado nke ùgwù na amamihe nke Chineke n’enye Ọkpara Ya ikike. Osi-agụgọ wee dị n’etiti ndị mụọ-ozi. Ekwensu na ndị ya o mekutara, ndị n’agbali iwụghari ọchịchị nke Chineke, nwewọkwara nmasị ileba anya na omimi nke amamihe Ya imata ebum-n’obi Ya n’ibuli Jisọs elu, na inye Ya ụdị ikike ukuu dị otua n’enweghị ụsọtụ. Ha nupụrụ isi megide ikike nke Ọkpara Chineke, e wee mee ka ndị mụọ-ozi niile biakọọ n’iru Nna, ka e wee kpebie ikpe ha. E kpebiri na a g’achụpụ Ekwensu site n’eluigwe, na ndị mụọ-ozi ahụ, ka ha ra bụ ndị ha na Ekwensu jikọrọ aka na nnupu-isi ahụ, ka a ga-chụpụkwa ha na ya. Mgbe ahụ agha wee daa n’eluigwe. Ndị mụọ-ozi tinyere aka n’ọgụ ahụ, Ọ masịkwara Ekwensu imeri Ọkpara Chineke, na ndị doro onwe ha n’okpuru ọchichọ obi Ya. Ma ndị mụọ-ozi ndị dị mma n’eziokwu meriri, e wee chụpụ Ekwensu, na ndị n’eso ụzọ ya, site n’eluigwe. NUA 9.2

Mgbe e mechibidoro Ekwensu ụzọ nke eluigwe, ya na ndị soro ya daa, mgbe ahụ ka o chetara na o tufuwo ịdị nsọ na ebube nke eluigwe rue ebighị-ebi. Mgbe ahụ ka o chegharịrị ma nwekwa nmasị ka a kpọghachi ya ọzọ n’eluigwe. O wee dị na njikere ị were ọnọdụ ahụ nke rukwaara ya, m’ọbụkwa ọnọdụ ọzọ nke a pụrụ inye ya. Ma e-e, eluigwe a pụghị ịnọ na ọghọm. Eluigwe niile pụrụ ịla n’iyi m’ọbụrụ na a kpọghachi ya; n’ihi na nmehie malitere n’ime ya, ọbụna nkpụrụ niile nke nnupu-isi dịkwa n’ime ya. Ekwensu e nwetawori ndị n’eso ụzọ ya bụ ndị kwenyeere ya na nnupu-isi ya. Ya na ndị n’eso ụzọ ya chegharịrị, wee kwa-akwa ma riọ ka a nabatakwa ha n’iru-ọma nke Chineke. Ma e-e, nmehie ha, ikpọ-asi ha, ekworo na anya-ụfụ ha adiwo ukuu nke Chineke n’apụghị ihichapụ. Ọ ghaghị inọgịde wee nata ntaramahụhụ ikpeazu ya. NUA 10.1

Mgbe Ekwensu mazuru nke ọma na a pụghị ịnabatakwa ya ọzọ n’iru-ọma nke Chineke, ekworo ya na ikpọ-asị ya malitere ipụta ihe. Ọ kpọkọtara ndị mụọ-ozi ya, wee tụa atụmatụ inọgịde n’ọlụ megide ọchịchị nke Chineke. Mgbe e tinyere Adam na Iv n’ogịge Iden ọma ahụ, Ekwensu nọrọ n’atụ atụmatụ ibibi ha. Ọ gbara izu ya na ndị mụọ ọjọọ ya. Ọdịghị ụzọ a pụrụ iji napụ dị na nwụnye ndịa obi-ụtọ ha ma ha nọgịde n’irubere Chineke isi. Ekwensu apụghị inwe ike n’ebe ha nọ ma ọ bụghị ma ha buru ụzọ nupụrụ Chinke isi, ma tufue iru-ọma Ya. E kpebiri na Ekwensu g’eyiri ụdi ọzọ, ma gosipụta nmasị n’ebe madụ nọ. Ọ ghaghị ikwu okwu mkpasu-iwe megide eziokwu nke Chineke, tinyekwa obi-abụa ma Chineke ọ dịkwa ka okwu-ọnụ Ya si dị, ọzọ kpaliekwa ha iju ajụjụ ma durukwa ha inyọcha omimi atụmatụ nke Chineke., bụ nke Ekwensu nwekwara ọmụma-ikpe na ya, ma n’eche uche banyere nmachi a machigịdere ha n’osisi nke amamihe ahụ. NUA 11.1