Olileanya Dị Ukuu

55/75

Isiokwu 9—Isi Itoolu .Olile Anya Nke Bụ Ya

Nkwa ahụ bụ nke ekwere banyere ọbịbịa abụọ nke Kraịst imezupụta ọlụ mgbapụta dị uku, bụ kpọm kwem isi okwu nke nọ n’ihe niile Akwụkwọ nsọ na-eme ka ọ pụta ihe. Site na Iden, ụmụ nke okwukwe bụụrụ ndị nọgidere na-eche ma na-ele anya ọbịbịa Onye ahụ ekwere ha na nkwa ịkpọghachi ha na Paradaịs ahụ bụ nke furu efu. OdU 76.1

Ịnọk, nke bụ onye nke asaa na ndị sitere n’usoro ọmụmụ Adam, bụ onye ya na Chineke lụkọtara ọlụ narị arọ atọ, kwupụtara sị, “Lee, onye nwe anyị bịara, Ya na ndị nsọ Ya anapụghị ịgụta ọnụ, ikpe mmadụ niile ikpe” Jud 14, 15. Job, n’ime abalị nke ọnwụnwa anwara ya tiri mkpu sị, “Ma mụ onwem amawo na onye nzọpụtam na-adị ndụ. Na Ọ ga-ebili kwa ọtọ n’elu aja n’ikpe azụ...Ọ bụ na m’gesi na anụ arụ m hụ Chineke. Onye mụ onwem ga-ahụrụ onwem, anya mụ abụọ ga-ahụkwa Ya, Ọ bụghịkwa onye ala ọzọ.” Job 19:25-27. Ndị edemede na ndị amụma nke Akwụkwọ nsọ bụụrụ ndị chere echiche banyere ọbịbịa nke Kraịst site na mkpụrụ okwu ndị na-ere ka ọkụ, sị, “Ka eligwe ñụrịa, ka ụwa tegharịakwa egwu ọñụ n’iru Onye Nwe anyị.: n’ihi na ọ bịawo; n’ihi na ọ bịawo ikpe ụwa ikpe. Ọ ga-eji ezi omume kpe elu ụwa dum mmadụ bi ikpe, Ọ ga-ejikwa ikwesi ntụkwasị obi Ya kpe ndị niile dị iche iche ikpe”Abụ Ọma 96: 11-13. OdU 76.2

Dịka Aịsaịa kwuru sị, “Aga asịkwa n’ụbọchị ahụ, le Chineke anyị ka nka bu; anyị elewo anya Ya, Ọ ga-azọpụtakwa anyị; nke a bụ Jehova; anyị elewo anya Ya, k’anyị tegharịa egwu ọñụ, ñụrikwa na nzọpụta Ya” Aịsaịa 25:9. OdU 76.3

Onye Nzọpụta ahụ kasiri ndị na-eso ụzọ Ya obi site na nkwa-ahụ o kwere banyere ọbịbịa nke abụa Ya: “N’ụlọ Nnam, ọtụtụ ebe obibi dị; ...n’ihi na ana ni aga idoziri unu ebe. Ọ bụrụkwa na mu aga idoziri unu ebe, aga m abịa ọzọ, M gaanarakwa unu nye Onwem”. “Ma mgbe ọ bụla Nwa Nke Madụ ga-abịa n’ebube Ya, Ya na ndị mmọ ozi nile, mgbe ahụ ka Ọ gaanọkwasị n’oche eze ebube Ya, ma n’iru Ya ka a ga-eme ka mba niile zụkọ” (Matiu 25:31, 32). OdU 76.4

Ndị mmọ ozi mekwara ka o doo anya nke ọma, bụ nkwa nke nlọghachi Ya nke ugboro abụa: “Jisọs nke a, Onye anapụrụ n’ebe unu nọ rigo n’eligwe, ga-abịa n’otu aka ahụ dịka unu kiriri Ya ka Ọ na-aga n’eligwe” (Ọlụ Ndị Ozi 1:11). Ma Pọl gbakwara ama sị, Onye Nwe Anyị n’onwe Ya ga-ewere oke ịkpọ oku, were olu isi ndị mmọ ozi, were kwa opi nke Chineke, si n’elu rịdata” (1 Tesalonaịka 4:16). Onye amụma nke Patmọs kwuru sị, “Le, Ọ naabịa, Ya na igwe ojii; anya nile ọ bụla ga-ahuzukwa Ya” (Nkpughe 1:7). OdU 77.1

N’oge ahụ, ọchịchị aka ike nke ihe ọjọọ ga-abụ ihe a gaemebi: “Ala eze nke ụwa, aghọwọ ala eze nke Onye Nwe Anyị, na nke Kraịst Ya: Ọ ga-abụkwa Eze rue mgbe niile ebighi ebi” (Nkpughe 11:15). “Onye Nwe Anyị Jehova ga-eme ka eziomume na otuto pute n’iru mba niile” (Aịsaịa 61:11). OdU 77.2

N’oge ahụ, ọchịchị ala eze nke Mesaịa ahụ, bụ nke udo jupụtara, ga-ewere ọnọdụ. N’ihi na Jehova akasiwo Zaịọn obi: Ọ kasiwo mkpọ mkpọ ebe ya nile, me ka ọzara ya dịka Iden, me ka ala ya nke ihe na-adịghị ya, dịka ubi nke Jehova gbara ogige” (Aịsaịa 51:3). OdU 77.3

Ọbịbịa abụọ nke Onye Nwe Anyị bụ olile anya nke ndị naeso ụzọ Ya oge nile. N’etiti nhuju anya na oke mkpagbu, “na-eche olile anya ahụ dị ngọzi na ngosi nke ebube nke Chineke uku ahụ, nke bụkwa Onye Nzọpụta anyị, Jisọs Kraịst, bụrụ olile anya ahụ nke dị ngọzi” Taịtọs 2:13. Pọl mere ka ọ pụta ihe na mbilite n’ọnwụ ahụ weere ọnọdụ n’oge ahụ Onye Nzọpụta anyị ga-abịa nke ugboro abụa, bụ oge ndị nile nwụrụ anwụ n’ime Kraịst gaebilite, ma we zutekọ Kraịst na mbara eligwe, ha na ndị ezi omume dị ndụ bụ ndị a ga-enwogharị”. N’ụzọ dị otu a, ka ọ sịrị, “Otu a ka anyị na Onye Nwe Anyị ga-anọkwa mgbe nile. Ya mere werenụ okwu ndị a na-akasirita ibe unu obi” 1 Tesalonaịka 4: 17, 18. OdU 77.4

N’ime agwe etiti Patmọs, onye na-eso ụzọ Kraịst ahụ, nke ahụrụ n’anya nụrụ nkwa ahụ nke Kraịst kwere, “ma lee, ana m abịa ọsọsọ” ma nzaghachi ya bụ nkwupụta na ekpere Nzụkọ, “Amen, bịa Onye Nwe Anyị Jisọs” Nkpughe 22:20. OdU 78.1

Site n’ime ụlọ mkpọrọ gbara ọchịchịrị, site na nkegide na agbụ, site n’ịtụ mkpọrọ nke ụkwụ na aka, bụ ebe ndị nsọ egburu egbu gbara ama nye eziokwu, gafesịrị nnarị arọ dị iche iche bụrụkwa nkwupụta nke okwukwe na olileanya ha. “Na mgbe emere ka mbilite n’ọnwụ nke Kraịst do ha anya nke ọma, ma site n’otu a me ka ha mata na mbilite n’ọnwụ dịịrị ha n’òge Ọ ga-abịa, ma n’ihi nka” dịka otu n’ime ndị Kristen ahụ kwupụtara nke ọma, “ha leliri ọnwụ anya, ma bụrụ ndị achọpụtara na ha dị elu karia ya”.1 Ndị Waldense nabatara ụdịrị okwukwe dị otu a. Mmadụ ndị dịka: Wycliffe, Luther, Calvin, Knox, Ridley na Baxter lere anya nke okwukwe banyere ọbịbịa nke Onye Nwe Anyị. Ụdịrị olile anya ahụ bụụrụ nke Pọl na Pita lere anya ya, bụrụkwa olile anya nzukọ ahụ nọọrọ n’ime ọzara, na nke ndị ahụ hazigharịrị okpukperechi ndị Kristen. OdU 78.2

Olu amụma abụghị nanị na o kwuru ọdịdị mpụta ihè nke ọbịbia ya, nakwa ebumnobi ya, kama o kwupụtara ihe ịrịba ama dị iche iche bụ ihe ụmụ madụ ji amata mgbe oge ahụ dị nso karịa. “Ihe ịrịba ama dị iche iche ga-adịkwa na anyanwụ na ọnwa na kpakpando” Luk 21:25. “Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghị enyekwa ihe ya, kpakpando ga na-adakwa site n’eligwe, a ga-eme ka ihe nile nke dị n’eligwe me mkpatụ. Mgbe ahụ, ha gaahụkwa Nwa Nke Madụ ka Ọ na-abịa n’igwe ojii, na ike na oke ebube: Mak 13:24-26. Onye dere akwụkwọ Nkpughe kọwasịrị ihe ịrịba ama nke mbụ n’ụzọ dị otu a, “M we hụ mgbe ọ saghere akara nke isii, oke ala ọma jijiji we da, anyanwụ we ihe ojii dịka akwa mkpe na-eji nji nke anụ kpa, ewe me ọnwa ka ọdizue dịka ọbara (Nkpughe 6:12). OdU 78.3

Onye Nzọpụta ahu mere ka ọ pụta ihe ọnọdụ banyere ndaghachi azụ na okwukwe bụ nke ga-ewere ọnọdụ tutu Kraịst abịa ọzọ. Nye ndị ahụ ga-ebi ndụ na ọgbọ dị otu a, ndụmọdụ nke Kraịst bụ: “Ma na-ezenụ onwe unu, ka aghara imebiga ajọ ihe oke, na ịñụbiga mmanya oke, na nchegbu nke ndụ a, bogbu obi unu, ma eleghị anya, ụbọchị ahụ we bịakwasị unu na mberede”. “Ma mụrụnụ anya n’oge ọ bụla, na-arịọ arịrịo, ka unu we nwe ike ịgbanarị ihe nile ndị a nke gaje ime, na iguzo n’iru Nwa Nke Madụ” (Luk 21:34, 36). OdU 79.1