Olileanya Dị Ukuu

54/75

Edebere Ezi Ụbọchị Izu Ike Mgbe Nile

Malite n’ụbọchị ahu rue taa, a na-edebe ụbọchị izu ike. Ọ bụ ezie na “nwa nke mmebi iwu” na-aga n’iru ịzọtọ ụbọchị nsọ Chineke, ma n’ebe nzuzo nile, ndị ji obi zuru oke bịa ife Chineke naakwanyere ụbọchị a ugwu. Malite n’oge Mmezi Ihe (Reformation), ọtụtụ n’ọgbọ dị iche iche ka nọkwa na-asọpụrụ ụbọchị ahu. OdU 72.3

Eziokwu, ndụbọchị a jikọrọ onwe ha “n’ozi ọma nke ebighi ebi” ga-ewepụta nzukọ Chineke iche mgbe Ọ ga-abịa. “N’ebe a ka ntachi obi ndị nsọ dị, bụ ndị na-edebe ihe Chineke nyere n’iwu, na okwukwe Jisọs” Nkpughe 14:12. OdU 72.4

Ndị niile natara ihè ahụ maka ebe nsọ na iwu Chineke juputara n’obi ụtọ mgbe ha jikọrọ na eziokwu. Ọ masịrị ha ka e mee ka ihè a rute onye ọ bụla kwere na Kraịst. Ma eziokwu nke ya na ọchịchọ ụwa abụghị otu, bụ nke ọtụtụ jụrụ, ọ bụna mgbe ha naekwu na ha bụ ndị neso ụzọ Kraịst. OdU 72.5

Mgbe emere ka ihe gbasara ụbọchị izu ike pụta ihe, ọtụtụ sịrị: Anyị na-edebe Sọnde nsọ ọtụtụ oge gara aga, ndị mụrụ anyị debere ya nsọ, ọtụtụ ndị ezigbo mmadụ nwụkwara n’ime ya. Ọ bụrụ na anyị atụgharịa idebe Satọde nsọ, anyị agaghị anọ n’ụzọ ọtụtụ mmadụ na-aga. Gịnị ka mmadụ ole na ole ndị na-edebe Satọde nsọ pụrụ ime n’etiti ọtụtụ ndị na-edebe Satọde nsọ? Ọ bụ ịrụ ụka ndị yiri nke a mere ndị Ju ji hụ onwe ha dịka ndị naemeghị ihe ọjọọ ọ bụla n’ịju Kraịst. Ọ bụ ya mere n’oge Martin Luther, ndị na-eso ihe Popu (Pope) kwuru, rụkwara ụka na ndị Chineke a maara aha ha nọgidere na Katọlik rue ọnwụ. N’ihi nke a, ịmata ihe gbasara Chineke naanị ezuola oke. Ụdị nchepụta dị otu a bụ ihe mgbochi na-agaghị anabata otuto nke okwukwe. OdU 73.1

Ọtụtụ na-ahụta na ofufe ụbọchị Sọnde bụrụ ejirimara chọọchị otụtụ afọ ndị gara aga. Nke a abụghị eziokwu. Ife Chineke ụbọchị Sabatị na iso ihe nile gbasara ya bụ okenye nye ofufe ụbọchị Sọnde, n’ihi na ofufe ụbọchị Satọde malitere mgbe ekere ụwa - Onye Ochie Ahu hiwere ya. OdU 73.2

Ụfọdụ lefuuru akwụkwọ nsọ anya, na-ajụ, “gịnị mere ndị amaara aha ha amataghị ihe gbasara Sabatị? Mmadụ ole na ole kwekwara ihe dị otu a. Anyị anaghị asị na ndị na-ekwu ihe ndị a karịrị ndị amaara aha ha ihe ama”. OdU 73.3

Ịza okwu dị otu a, ọ dị mkpa ka anyị kwuo ihe dị na akwụkwọ nsọ n’ụzọ Onye Nwe Anyị si na-eso ndị Ya n’ọgbọ niile. Ihe mere Chineke adịghị akpọrọ mgbe nile ndị amaara aha ha mgbe Ọ chọrọ ime ihe ọhụụ bụ n’ihi na ha na-atụkwasị obi n’ihe ha dere nye onwe ha na nhazi nkuzi ha nile, bụrụ ndị ihe naakọghị, na-achọghị nkuzi nke Chineke. Ndị nwere mmụta naakaghị ụda, ọtụtụ oge ndị Chineke na-akpọrọ iwepụta eziokwu, ọ bụghị n’ihi na ha enweghị oke mmụta, kama, n’ihi na ha nyere Chineke onwe ha ikuziri ha ihe ha na-amaghị. Iweda onwe onye n’ala na ige ntị ha mere ha ndị uku. OdU 73.4

Ọ-bụghịrị atụmatụ Chineke ka Isrel wagharịa n’ime ọzara afọ iri anọ; Ọ chọrọ idu ha gaa ala Kenan, hiwe ha ebe ahụ dịka ndị nsọ, ndị ga-enwe obi ụtọ. Ma “anyị rịbakwata ama na ha apụghị ịba n’ime ya n’ihi ekweghị ekwe” Ndị Hibrụ 3:19. N’aka nke ọzọ, ọ bụghị nzube Onye Nwe Anyị na ọbịbịa Ya ga-anọ ọdụ, ndị Ya e we nọ n’ime ọnọdụ ọjọọ na ahụhụ n’ụwa. Ekweghị ekwe kewapụrụ ha na ebe Chineke nọ. Obi ebere n’ihi mmadụ, mere ka Chineke nọọ ọdụ ịbịa, ka ndị mmehie nu ịdọ aka na ntị ma nwe ebe mgbapụ tupu Chineke awụsa iwe Ya. OdU 74.1

Taa, dịka n’oge gara aga, eziokwu na-akpali ndọrọ ndọrọ. Otụtụ na ewere obi ọjọọ buso agha agwa, na ebumnobi ndị naakwado eziokwu ọtụtụ mmadụ na-achọghị. A kpọrọ Elija onye naemekpa Isrel ahụ; Jeremaịa, onye na-eyi egwu, Pọl, onye naemetọsị ụlọ ukwu Chineke. Site n’ụbọchị ndị ahụ rue taa, ndị niile na-erube isi n’eziokwu bụ ndị akpọrọla ndị na-akpọrọ mmadu, ndi okwukwe na-agba ara, ma ọ bụ ndị nkewa. OdU 74.2

Nkwupụta okwukwe ndị nsọ, na ndị niile egburu egbu, ihe ima atụ ịdị nsọ na ịnọgidesi ike n’ihe ọma, na-ewuli agbamume na ndụ ndị niile ga-eguzo dịka ndị ama Chineke. Ndị ozi Chineke ugbu a, ka a na-akpọ, “were akpịrị kpọ nkpu dịka olu opi, we gosi ndị m njehie ha, na ụlọ Jekọb, mmehie ha”. Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, onye nche ka m doworo gị nye ụlọ Isrel; Ị ga-anụkwa okwu site n’ọnụ m, dọ ha aka na ntị site na m” Aịsaịa 58:1; Ezikiel 33:7. OdU 74.3

Ọnọdụ siri ike na-egbochi ịnabata eziokwu bụ n’ihi na ọ naghị ekwe onye ọ bụla ime ihe na-atọ ya ụtọ. Ọ na-emekwa ka elee mmadụ anya ka onye nzuzu. Nke a bụ otu eziokwu onye ọ bụla kweere na ya. Ma ndị ji ezi obi na-efe Chineke anaghị eche ka mmadụ niile nabata eziokwu tupu ha esonye n’ime eziokwu. OdU 74.4

Ha na-eburu obe ha, soro onye ozi Pọl na-ekwu na “mkpagbu anyị nke dị mfe, nke dị na nwa oge a, na-alụpụtara anyị ebube nke uku ri nne karịa ihe niile, bụ ebube nke dị arọ, dịkwa ebighi ebi”; soro otu onye ochie, “ebe ọ gụrụ ịta ụta nke Kraịst anyị ka akụ dịkarịrị akụ niile nke Ijipt uku” 2 Ndị Kọrint 4:17; Ndị Hibru 1l:26. OdU 75.1

Ka anyị họrọ ezi ihe n’ihi na ọ bụ ihe kwesiri ekwesi, hapụrụ Chineke nsogbu nile ga-esi na ya pụta. Ọ bụ ndị mmadụ, ndị na-eme ihe dịka o kwesiri,; ndị nwere okwukwe, na kwa ndị nwere obi ike, ka e ji lụa ọlụ ntute. Ọ bụkwa ndị dị otu a ka Chineke ga-eji lụa ọlụ ntute n’oge anyị. OdU 75.2