Olileanya Dị Ukuu

45/75

Naanị Site N’okwukwe

Ọlu nkaa ka a pụrụ imejupụta naanị site n’okwukwe e nwere n’ime Kraist, sitekwa n’ike Mụọ Chineke nke bi nime obi. Onye nke Kraist gēnwe nmetụta nke íme nmehie kama ọ gānọgidesike mgbe nile n’ibu ághá megide ya. N’ebea ka a chọrọ inye-áká nke Kraist. Adịghi-ike nke madụ gējikọ aka n’ike nke Chineke, ma okwukwe gētikwa mkpu sị: “Ekele dịrị Chineke Onye nēnye anyị nmeri site n’aka Onye-nweanyị Jisọs Kraist.” Ndị IKọrint 15:57 OdU 57.1

Ọlụ nke odido-nsọ nābụ ihe nke nēto-eto. Mgbe onye nmehie chọtara udo n’agbata ya na Chineke n’oge nchegharị ya, mgbe ahụ ka ndụ onye nke Kraist maliteworo. Ugbua ka ọ “nāga n’iru rue ntozu-oke,” n’itó-etó “rue n’ihe ọtụtụ nke ọdịdị ntozu-oke n’ime Kraist.” “Anam agbasi-ọsọ ike irute akàrà-okè nke ịgba-ọsọ ka m wee nata ihe a nāgbata n’ọsọ nke ọkpụkpọ ahụ dị-elu nke Chineke nime Kraist.” Ndị Hibru 6:1; Ndị Efesọs 4:13; Ndị Filipai 3:14 Ndị nile nataworo odido-nsọ nke akwukwọ-nsọ gēgosị nweda n’ala. Ha nāhụkwa ezughi-oke nke ha na ntụnyere nke izu-oke nke Onye ahụ nēnweghị ụsọtu. Onye-amụma Danel bụworo ihe-atụ nke ezi odido-nsọ. Kama ịgụ na ya dị ọcha dịkwa nsọ, onyeamụma nkaa e nyere ùgwù gụkọrọ onwe ya n’etiti ndị kachasị nmehie n’ụmụ Izrel mgbe ọ nārịọtara ndị ya arịrịọ n’iru Chineke. Danel 10:11; 9:15, 18, 20; 10:8, 11. OdU 57.2

N’weli onwe-onye elu a pụghị ịdị, ọ dịghịkwa ịnya-isi nke e nweghị nmehie a gānụ site n’ọnụ ndị nile nēje-ije n’onyonyo nke obe Kalvarị. Ọ ganēmetụ ha na ọ bụ nmehie ha kpataworo ihemgbu ahụ nke tiwara obi Ọkpara Chineke, ma uche nkaa gēdurukwa ha rue oke nweda n’ala. Ndị nile nēñomi ibi ndụ dịka nke Jisọs nēlepụta n’ụzọ were anya karị bụ adịghị-ike na ọdịdị nmehie nke madụ, nke naanị olileanya ha bụ n’ezi-omume nke Onye nzọpụta ahu a kpọgbuworo nke bilikwara n’ọnwụ. OdU 57.3

Odido-nsọ nke a nānụ aha ya n’okpukperechi ugbua bụ nke nwere mụọ nke ibuli onwe-onye elu nējighikwa iwu Chineke kpọrọ ihe ọbyla nke nēnyekwa ya akara nke ihe nēsiteghị n’akwukwọ-nsọ. Ndị nēzi ozizia nēkwu na odido-nsọ bụ ọlụ otu oge nke ọ bụ site “naanị n’okwukwe” ka ha nētoru odido-nsọ zuru oke. “Naanị Kwere,” ka ha nāsị, “ngọzi ahu gābụkwa nke gị.” Ọ dịghịkwa mgbalị ọzọ kwesịrị ka a tụa-anya n’aka onye ahụ nke nānara ya. N’otu oge ahụ, ha nāgọnarịkwa ikike nke iwu Chineke, nēkwukwa na a napụtawo ha pụa n’ọlụ nke idebe iwu. Kama ọ bụ ihe pụrụ omume ịdị nsọ n’enweghị otu-olu n’ụkpụrụ nile nke nēgosiputa ọdịdị nke Chineke na ọchịchọ Ya? OdU 58.1

Àmà nke okwu Chineke megidere ụkpụrụ aghọm nkaa bụ okwukwe nādịghị ọlụ. Ọ bụghị okwukwe nākụrụ iru-ọma nke eluigwe mgbe n’ọdịghị ekwenyere n’ụkpụrụ nke a gbakwasịrị ụkwụ nēme ebere. Kama nkaa bụ okwukwe-ụfụrụ. Lee Jems 2:1424. OdU 58.2

Ka onye ọbụla ghara iduhie onwe-ya na ha pụrụ ịbiaru ịdị-nsọ mgbe ha makwaara na ha nēmebi ọbụna otu nime iwu nke Chineke. Nmehie a maara nke ọma nēmenyụ olu ọgbụgba-àmà nke Mụọ-nsọ ma nēkewapụkwa mkpụrụ-obi ahụ site n’ebe Chineke nọ. Ọ by ezie na Jọn nọgidesiri-ike n’ikwu banyere ịhụnanya ma o teghị nchichi ọbụla ime ka a mara ezi-agwa ndị ahụ sị na e doro ha nsọ ọbụna mgbe ha nọkwa nēmebi iwu Cheneke. “Onye nke nāsị, A mawom Ya, ma ọ dịghị edebe ihe nile O nyere n’iwu, ọ bụ onye ụgha, ezi-okwu a dịghịkwa nime onye ahụ: ma onye ọbụla nke nēdebe okwu Ya, ọ bụ nime onye ahụ ka e meworo ka ịhụnanya Chineke zue oke nezie.” lJon 2:4,5. N’ebea ka ihe n’nwale nke nkwupụta onye ọbụla dị. Ọ bụrụ na ụmụ-madụ nēme ka ụkpụrụ nile nke Chineke talata ma dịkwa ala, ọbụrụkwa na ha nēmebi otu n’ime ihe ndia dịkasịrị nta nke e nyere n’iwu ma zikwa ụmụ madụ otua” (Matiu 5:18, 19), anyị gāmara na akụkọ ha enweghị ntọ-ala ọbụla. OdU 58.3

Nkụrụ nke e nweghị nmehie bụkwa ngosị na onye ahụ nke nēkwu otua a dịghị nsọ mọlị. O nweghịkwa ezi nghọta banyere enweghị ụsọtu nke ịdị-ọcha na ịdị-nsọ nke Chineke, na nmejọ na ajọ ihe nke nmehie. Ka ọ nādị anya n’ebe Kraist nọ bụkwa ka ọ nāhụ onwe ya dịka onye ezi-omume n’anya nke onwe ya. OdU 59.1