Olileanya Dị Ukuu
Gini Bụ Odido-Nsọ?
Ọtụtụ nchepụta n’ezighi-ezi nēsite na nlehgara anya ma-ọbụ a nabataghị iwu nke Chineke. Nchepụta ndia nile, nke ụkpụrụ ha jọkwara njọ, burukwa nlụpụta aghọm di iche iche, ka ndị madụ nānabata n’ebe nile. OdU 56.2
Pọl nēkwupụta sị, “Nkaa bụ ihe Chineke nāchọ bụ ka e doo unu nsọ”. Akwụkwọ-nsọ nēzikwa n’ụzọ were-anya ihe bụ odidonsọ na ụzọ a gēsi torue ya. Onye nzọpụta kpere ekpere maka ndi nēso-ụzọ Ya: “Were ezi-okwu Gị doo ha nsọ: okwu Gị bụ eziokwu.” Ma Pọl nēzikwa sị na ndị kwere-ekwe gābụkwa ndị “e doro ya nsọ nime Mụọ-Nsọ” Ndị ITesalọnika 4:3; Jọn 17:17; Ndị Rom 15:16. OdU 56.3
Gịnị bụ ọlụ nke Mụọ Nsọ? Jisọs gwara ndị nēso-ụzọ Ya “Mgbe ọbụla Onye ahụ gābia, bụ Mụọ nke ezi-okwu, Ọ gēduba unu n’ezi-okwu nile.” Jọn 16:13. Ma onye ọbụ-abụ nēkwukwa sị: “Iwu gị bụ ezi-okwu ahụ” Ebe ọ bụ na iwu nke Chineke dị “nsọ ma zie-ezie ma dịkwa nma”, àgwà ọbụla nke a mụtara site nịña ntị n’iwu ahụ gādịkwa nsọ. Kraist bụ ihe àtù zuru oke nke ụdị agwa dị otua. Ọ nāsịkwa; “Mụ-onwem debeworo ihe nile nke Nnam nyere n’iwu” “Mụ-onwem nēmekwa ihe nātọ Ya ụtọ mgbe nile” Jọn 15:10; 8:29. Ndị nēso-ụzọ nke Kraist gābụ ndị dịka Ya - site n’amare nke Chineke nāmụta àgwà ndị nwere otu-olu ha na ụkpụrụ nke iwu Ya dị nsọ. Nkaa bụkwa odido-nsọ nke akwụkwọnsọ nēkwu. OdU 56.4