Ndọndọ Ukuu Ahụ

33/42

Isi Nke 32—Nkwagharị Ahụ

Ahụrụm ụfọdụ ndị nwere okwukwe sịrị ike na akwakwa akwa dị-ilu, n’arịọkwa Chineke arịrịọ. Iru ha gbarụrụ agbarụ, ma jupụtakwa n’oke echiche, nke gosipụtara ndọli nke ime-mụọ ha. A na ahụkwa nguzosike na ikwesi ntụkwasi-obi n’iru ha, ọbụna mgbe ọkpụrụkpụ ọsụsọ n’esite n’egedege iru ha, n’adapụ. N’ogea na oge ọzọ iru ha na enwupụta site n’akara nke iru-ọma Chineke, ma n’otu mgbekwa ọnọdụ nro ahụ, nke ichọsi ihe ike, na ọnụ-ọkụ nke obi biakwasikwara ha. NUA 194.1

Ndị mụọ-ọjọọ gbara ha gburu-gburu, na akwagide ha n’ọchịchịrị ha, iwepụ Jisọs n’anya ha, ka e wee dọrọ anya ha nye ọchịchịrị ahụ gbara ha gburu-gburu, ka ha wezuga ntụkwasị-obi ha na Chineke, ma nwee ntamụ megide Ya. Naanị nchekwa ha bụ ilekwasi anya ha n’elu. Ndị mụọ-ozi ka e nyere iwu ilekọta ndị nke Chineke, ma dịka ọnọdụ ọjọọ a nke sitere na nrụgịde nke mụọ-ọjọọ ndịa gbara gburu-gburu, ndị mụọ-ozi ndịa, e nyere iwu ilekọta ha, n’ekpugịdekwa ha mgbe niile site na nku ha n’aghasasikwa ike ọchịchịri ahụ gbara ha gburu-gburu. NUA 194.2

ụfọdụ, ndị m hụrụ, esoghịkwa n’ọlu nke arịrịọ obi ntiwa nka. Ha dịka ndị n’ọgbasaghị n’ejighịkwa ya kpọrọ ihe. Ha adịghịkwa emegịde ọchịchịrị ahụ gbara ha gburu-gburu, o wee kpuchigịde ha dịka ọkpụrụkpu igwe ojii. Ndị mụọ-ozi nke Chineke rapụkwara ha, wee je inyere ndị ahụ n’ekpesi ekpere ike aka. A hụrụ m ndị mụọ-ozi nke Chineke ka ha jere ọsọsọ inyere ndị niile ahụ aka bụ ndị ahụ ji ike ha niile n’agba ụlighịlị megide mụọ-ọjọọ ndị ahụ, n’achọkwa inyere onwe ha aka site n’ikpọku Chineke n’ogologo ntachị-obi. Kama ndị mụọ-ozi ahụ rapụrụ ndị niile n’emeghị mgbali ọbụla inyere onwe ha aka, ha punarikwara m n’anya. NUA 195.1

Ka ndịa n’ekpe ekpere nọgịdesịrị ike na akwa ha, mgbe ụfọdụ ihè okụ sitere na Jisọs biakwasịrị ha, n’agbakwa obi ha ume, ma mesaakwa iru ha. NUA 195.2

M wee jụa ihe nka pụtara bụ nkwagharị ahụ nke m hụrụ, e gosịrị m na ihe g’akpata ya bụ ezi-àmà ahụ e kwupụtara site n’ọnụ onye-àmà ezi-okwu ahụ nye ndị Laodecia. Ọ g’enwe nhukụ ya n’ime obi onye n’anara àmà ahụ, ọ g’edurukwa ya ibuli ogo ya ma wụsakwa ezi-okwu ahụ guzoziri eguzozi. Ama nka guzoziri eguzozi ka ụfọdụ n’agaghị anagịde. Ha g’ebili megide ya, ma nka g’akpata nkwagharị n’etiti ndị nke Chineke. NUA 195.3

A hụrụ m na àmà nke onye ezi-àmà ahụ a k’abụghị ihe a ñara ntị rue ọkàrà ya. Ama ahụ dị nro nke bụ ndabere ndụ nke nzukọ, ka a kpọrọ ihe efu, ma jụkwa. Ama nka aghaghị ilụ ọlụ nchegharị dị omimi, ma ndị niile natara ya n’ezie, g’aña ya ntị, ma bụrụkwa ndị e mere ka ha dị ọcha. NUA 196.1

Mụọ-ozi ahụ wee sị gee ntị! Na ngwa-ngwa a nụrụ m olu nke dara dịka ọtụtụ ihe abu dị iche-iche, nke n’adakọta ọnụ n’ima-mma, dịkwa ụtọ na ntị. Ọ karịrị abụ ọbụla nke m nụworo na ndụ. Ọ dị ka ihe jupụtara n’ebere, ọmiko, nwụli-elu, na ọñụ dị nsọ. Ọ kpaliri arụ m niile. Mụọ-ozi ahụ wee sị, Lee anya! E wee tụgharia uche m n’ebe ọgbakọ ahụ nke m hụworo na mbụ, bụ ndị a kwagharịrị nke ukuu. E gosịrị m ndị m hụworo na mbụ mgbe ha n’akwa akwa, n’ekpekwa ekpere n’obi ntiwa. A hụrụ m na ọgbakọ nke ndị mụọ-ozi n’eche ha nche mụbara amụba, na eyibekwara ha ihe-agha site n’isi ha rue n’ụkwụ ha. Ha n’agakwa n’usoro dị mma, nwekwa obi-ike dịka otu ndị-agha. Iru ha gosipụtara oke nkpagbu nke ha nagịdeworo, na ndọlị anya-miri nke ha gabigawokwara. Ma ọdịdị ha, nke jupụtaworo n’ihe mgbu nke obi, n’enwụkwa ugbua site na ihe nke ebube nke eluigwe. Ha e nwetawo nmeri, nke mere ka ha nwee obi ekele dịkarị omimi, na ọñụ dị nsọ. NUA 196.2

Ọnụ-ọgụgụ nke ọgbakọa adiwo nta. Ụfọdụ abuwo ndị a kwapụrụ, ma rapụ n’akụkụ ụzọ. Ndị ahụ n’ejighị ihe kpọrọ ihe, n’esoghịkwa ndị ji nmeri na nzọpụta ha kpọrọ ihe nke oma ma nọgịdesiekwa ike n’ikwa akwa n’arịrịọ, e nwetaghị ya, kama a rapụrụ ha n’azụ n’ime ọchịchịrị, ma ọnụ-ọgụgụ ha ka e mejupụtakwara mgbe ahụ site na ndị ọzọ na ejide ezi-okwu ahụ, n’abatakwa n’ọgbakọa. Ndị mụọ-ọjọọ ahụ nọkwa n’arugịde ha gburu-gburu, kama ha enweghịkwa ike ọbụla n’ebe ha nọ. NUA 196.3

A nụrụ m ka ndị ahụ e yikwasịrị ihe-agha na ekwupụta ezi-okwu ahụ n’ike nke ukuu. O nwere ezi nhukụ. A hụrụ m ndị e keworo agbụ, ụfọdụ ndị nwụnye ka dị ha keworo agbu, ma ụfọdụ ụmụ ka ndị mụrụ ha kekwara agbụ. Ezi onye ọbụla nke e gbochiworo ịnụ ezi-okwu ahụ, ji ọnụ-ọkụ nke obi ugbua n’ejidesi ezi-okwu ahụ e kwuru ike. Itụ ụjọ niile nke ndị ezi-n’ụlọ agasiwo. Naanị ezi-okwu ahụ ka a n’ebuliri ha elu. Ọ dịrị ha mma dịkwara ha oke ọnụ-ahia karị ndụ. Agụọ ezi-okwu ahụ agụwo ha, akpịrị akpowọkwa ha nkụ. A jụrụ m ajụjụ ihe kpatara oke ngbanwe nka. Otu onye mụọ-ozi zara sị, ọ bụ miri ozụzọ nke ikpeazụ; nwụgharị ọhụụ nke sitere n’iru Onyenwe-anyị; oke iti-mkpu nke mụọ-ozi nke ato ahụ. NUA 197.1

Ike ukuu dinyere ndị ahụ a rọpụtara. Mụọ-ozi ahụ sịrị, Lee anya! A tụgharịrị uche m n’ebe ndị nmebi-iwu ahụ nọ, ma ọ bụ ndị n’ekweghịekwe. Ha niile ka a kpaliri. Chineke akpliwo ha ma mesuekwa ha iwe. Ọgbaghara, ọgbaghara, dị n’akụkụ niile. A hụrụ m ọtụtụ ihe e mere megide ọgbakọ nka, ndị nwere ike na ihe nke Chineke. ọchịchịrị gbachigịdere ha gburu-gburu, ma ha guzokwa ebe ha nọ, Chineke kwadoro ha, ha na atụkwasikwa Ya obi. A hụrụ m ka ha nwere mgbagwoju-anya. Emesia m wee nụ ka ha n’etikusi Chineke mkpu ike. Ogologo ehihe na abalị ka akwa ha n’akwusịghị kwa. A nụrụ m okwu ndịa, Ka emee uche gị, Chineke! Ọ bụrụ na ọ g’eneye áhà gị otuto, mere ndị gị ụzọ mgbapụ. Zọpụta anyị site n’aka ndị n’amaghị Chineke gbara anyị gburu-gburu. Ha ewerewo anyị nye ọnwụ; ma aka gị pụrụ iweta nzọpụta. Ndịa bụ okwu niile m pụrụ ikpọta n’echiche. Ha dị ka ndị mazuru na ha abụghị ihe ọbụla, ma gosipụta onwe ha ịnọ n’okpuru uche nke Chineke. Ma otu ọdị, madụ niile, onye ọbụla nọgịdesịrị ike n’arịrịọ, n’agbakwa mgba dịka Jekọb ka a zọpụta ya. NUA 197.2

Na ngwa-ngwa mgbe ha malitere akwa, ndị mụọ-ozi, n’obi-ebere ha karịdata izọpụta ha. Kama otu mụọ-ozi topụrụ etọpụ nke na enyekwa iwu gbochiri ha. Ọ sịrị, uche nke Chineke a kemezughị. Ha aghaghị iñụ site n’iko ahụ. Ha aghaghị ibu ndị e mere baptizim ahụ. NUA 198.1

Na ngwa-ngwa, a nụrụ m olu nke Chineke, nke mere ka eluigwe na elụwà kwaa ènèkè. Oke àlà ọma jijiji mara. Ọtụtụ ụlọ ka a kwatụrụ, nke dara n’akụkụ niile. Mgbe ahụ a nụrụ m iti-mkpu nke nmeri, n’oke olu, nke ụda abụ dịkwa ụtọ na ntị. Elegịdere m anya n’ọgbakọ ahụ ndị, na ntakịrị oge gara-aga, nọ n’oke ida-mba na nkpagbu. Ọnọdụ nke oru ha a tụghariwo. Ihè nke ebube awakwasiwọkwa ha. Lee ka ọdịdị ha magburu onwe ya mgbe ahụ. Ike ogwụgwụ niile n’akara niile nke ndọgbụ onwe-onye agasiwo. Ndụ ahụ ike na ịma-mma ka a n’ahụ n’iru onye ọbụla. Ndị-iro ha niile, na ndị n’ekpere arụsi gburu-gburu, dasịrị dịka ndị nwụrụ-anwụ. N’ihi na ha apụghị ịnagịde ihè ahụ nke wakwasịrị ndị nsọ ahụ, a gbapụtara. Ihè nka n’ebube a nọgịdere n’arụ ha, rue mgbe a hụrụ Jisọs n’igwe-ojii nke eluigwe, na ndị ahụ kwesịrị ntukwasị-obi, bụ ọgbakọ ahụ a nwaputsịrị ka e nwoghara out mgbe, n’otu ntabi anya, site n’ebube rue n’ebube. Ili niile ka e meghekwara na ndị nsọ pụtasịrị, e yikwasịkwara anwụghị-anwụ, n’eti-mkpu nmeri megide ọnwụ na ili, ma ha na ndị nsọ dị ndụ, ka e welikọrọ izute onye nwe ha n’elu; mgbe ọtụtụ olu abụ nke nmeri, jupụtara n’ebube nọ n’ire ha n’otu n’otu, na erupụtakwa site n’egbugbere-ọnụ ndịa niile, e doro nsọ. NUA 198.2