Ndọndọ Ukuu Ahụ

29/42

Isi Nke 28—Ozi Mụọ-ozi Nke Atọ Ahụ

Ka ije ozi nke Jisọs gwụsịrị n’ebe-nsọ ahụ, na ọ gafere n’ebe-nsọ nke kachasị ebe-nsọ, wee guzo n’iru igbe ahụ nke nagịdere iwu Chineke, O zigara mụọ-ozi ukuu ọzọ n’ime ụwà nke jikwa ozi nke atọ ahụ. Ọ tụkwasịrị ibe-akwụkwọ n’aka mụọ-ozi ahụ, ma dịka ọ rịdatara n’elu-ụwà n’ịdị ukuu na ike, o tiri-mkpu nke ịdọ-aka na ntị dị egwu, n’ụdi nke n’adịghị mgbe a kwanyere madụ ụjo dị otua. A kwadoro ozi a ime ka ụmụ Chineke nọrọ na nche, na ịgosi ha oge-awa nke ọnwụnwa na ihe-mgbu dị ha n’iru. Mụọ-ozi ahụ wee si, a g’akpụtakwa ha nso ịlụ ọgụ ha na nwa anụ-ohia ahụ na oyiyi ya. Olileanya nke ndụ ebigh-ebi ha bụ naanị inọgịdesike. Ọ bụ ezie na ndụ ha nọ na nkpagbu, kama ha a ghaghị ijidesi ezi-okwu ahụ ike. Mụọ-ozi nke atọ ahụ mechiri ozi ya n’okwu ndịa, N’ebea ka ntachi-obi nke ndị nsọ dị; ndịa bụ ndị n’edebe ihe Chineke nyere n’iwu, na okwukwe nke Jisọs. Ka ọ n’ekwụghachi okwu ndịa ọ tụrụ aka n’ebe-nsọ nke eluigwe. Uche nke ndị niile nabatara ozi a ka e duru gaa n’ebe-nsọ kachasị ebe-nsọ ebe Jisọs n’eguzo n’iru igbe ahụ, n’alụkwa ọlụ nke nnọchite anya ikpeazụ nye ndị niile obi-ebere fọdụụrụ, ma nyekwa ndị niile mebiworo iwu Chineke n’amaghị-àmà . Ọlu nke nkpuchi nmehie a ka a lụrụ nye ndị ezi-omume nwụru-anwụ ma nyekwa ndị ezi-omume dị ndụ. Jisọs n’alụ ọlụ nkpuchi nmehie nye ndị nwụworo anwụ, bụ ndị n’anataghị ihè nke dị n’iwu Chineke, ndị mehiekwara n’amaghị-ama . NUA 170.1

Mgbe Jisọs meghesịrị ọnụ-ụzọ nke ebe-nsọ kachasi ebe-nsọ, ihe nke ụbọchị izuike ka a hụrụ, ma ndị nke Chineke ka a g’anwalekwa ma nwapụtakwa, dịka Chineke nwapụtara ndị Izrel ochie, ihụ ma ha g’edebekwa iwu ya. A hụrụ m mụọ-ozi nke atọ ahụ ka ọ n’atụ aka n’elu, n’egosikwa ndị ahụ nwere nkpọchụ-iru ụzọ gara ebe-nsọ ahụ nke kachasị ebe-nsọ nke eluigwe. Ha wee soro Jisọs n’okwukwe banye ebe-nsọ ahụ nke kachasị ebe-nsọ. Ha achọtawokwa Jisọs ọzọ, nke kpaliri ọñụ na olileanya ha ọhụụ. A hụrụ m ka ha leghachiri anya azụ na atụgharịkwa uche n’ihe ndị gara-aga, sitekwa na nkwupụta nke ọbịbia abụa nke Jisọs, rue ka njem niile ha sị dị na ngafe-oge nke 1844. Ha hụrụ nkpọchụ-iru ha ka a kọwapụtara ya, ya mere ọñụ na ihe ido-anya biakwasịrị ha ọzọ. Mụọ-ozi nke atọ ahụ a wakwasiwo ihè n’ihe ndị gara-aga, nihe oge ugbua na nihe dị n’iru, ha matakwara na Chineke duru ha n’ezie site n’ụzọ omimi nke amamihe ya. NUA 171.1

E gosịrị m na ndị ahụ fọdụrụ sooro Jisọs banye n’ebe-nsọ ahụ nke kachasi ebe-nsọ, ma hụkwa igbe ahụ, na oche mkpuchi nmehie ahụ, nke ebube ihe ndịa mere ka ha tụa egwu nke ukuu. Jisọs welitere ihe mkpuchi nke igbe ahụ, ma lee! Mbadamba nkume ndị ahụ, e dekwasịrị iwu-iri ahụ n’elu ha. Ha leruru anya-àlà nụkpụrụ niile ndịa dị ndụ; kama ha malitekwara nleru-anya àlà ha ọzọ site n’itụ oke egwu mgbe ha hụrụ iwu nke anọ n’etiti iwu iri ahụ dị nsọ, ọbụna mgbe ihè karịrị ukuu n’enwukwasị iwu nke anọ ahụ karị iteghete ndị ọzọ, na ògwùgwù nke ebube gbakwara ya gburu-gburu. Ha ahụghịkwa ihe ọbụla ebea nke n’agwa ha na e bibiwo ụbọchị izu-ike, m’ọbụ gbanwee ya ka ọ bụru n’ụbọchị mbụ n’izu. A n’agupụtakwa ya dịka na mgbe e kwuru ya site n’ọnụ Chineke n’ike na ok’ebube n’elu-ugwu ahụ, ọbụna mgbe amụmà gburu na egbeluigwe gbakwara, na mgbe e edere ya site na mkpịsị-aka ya dị nsọ na mbadamba nkume ndia. Ụbọchị isii ka ị g’alụ ọlụ, jee ozi gị niile; ma ụchọchị nke asaa bụ ụbọchị izu-ike nke onye nwe gị na Chineke gị. Ọ tụrụ ha n’anya mgbe ha hụrụ mkpachara anya e nwere n’ebe iwu-iri ndịa dị. Ha hụrụ ka e dotere ha nso n’akụkụ Jehova, ebe a nechekwa ya site na nhukụ nke ịdị-nsọ ya. Ha hụrụ na ha a zọgịdeworị ụkwụ ha n’iwu nke anọ ahụ, na edebekwarị ụbọchị e wepụtara site n’aka ndị n’ekpere arụsi na ndị otu Pop, kama idebe ụbọchị nke Jehova doro nsọ. Ha wedara onwe ha n’iru Chineke, ma riekwa uju banyere nmebi-iwu ha n’oge ndị gara aga. NUA 171.2

A hụrụ m ihe isi-ụtọ ahụ n’ebe ndọba ihe ahụ ka ọ n’asọpụta anwụrụ-ọkụ mgbe Jisọs n’eche nkwupụta nmehie ha na ekpere ha n’iru Nna ya. Ma dịka ọ n’arigo, ihè nwụpụrụ enwụpụ nọkwasịrị n’isi Jisọs, na n’elu-oche nkpuchi nmehie ahụ; ma ndị ahụ ji obi, n’ekpesi ekpere ike, ndị o wutakwara rie nne na ha chọpụtara onwe ha dịka ndị n’emebi-iwu Chineke, ka a gọziri, iru ha wee nwụpụ n’ime olileanya na ọñụ. Ha wee sorokọ n’ọlụ nke mụọ-ozi nke atọ ahụ, ma weliekwa olu ha elu na ekwupụta okwu idọ-aka na ntị ahụ dị nro. Kama naanị ole na ole na mmalite naara ozi ahụ, kama ha nọgịdekwara ikwupụta ịdọ-aka na ntị ahụ n’ike. Mgbe ahụ m we hụ ọtụtụ ka ha nabatara ozi mụọ-ozi nke atọ ahụ, ma jikọkwa olu ha na ndị ahụ nke kwupụtaworo ozi ịdọ-aka na ntị ahụ na nmalite, ha niile wee bulie áhà Chineke elu ma gosikwa ịdị-ukuu Ya site n’idobe ụbọchị izu-ike ya e doro nsọ. NUA 173.1

Ọtụtụ ndị nakweere ozi nke mụọ-ozi nke ato ahụ a k’amataghị ihe ọbụla banyere ozi abụa ndị buru ụzọ. Ekwensu ghọtara nka, wee tụkwasịkwa anya ọjọọ ya n’arụ ha ikwatu ha; kama mụọ-ozi nke atọ ahụ nọgịdere n’atụrụ ha aka n’ebe-nsọ ahụ nke kachasị ebe-nsọ, ọbụna ndị nwekwara amamihe n’ozi ndị gara aga nọgịdekwara n’atụrụ ha aka ụzọ nke ebe-nsọ nke eluigwwe. Ọtụtụ hụrụ ezi nko ahụ nke kokotara ozi mụọ-ozi ndịa niile, ma werekwa ọñụ nara ya. Ha nabatara ha dum n’usoro ha, ma sorokwa Jisọs site n’okwukwe banye n’ebe-nsọ nke eluigwe. Ozi ndịa niile ka e gosịrị m dịka ihe nkogịde-aka nke n’ejide nzukọ. Ma dịka ndị madụ n’anara na aghotakwa ha n’otu n’otu, a na ekpuchitekwa ha site n’ọtụtụ nduhie nke Ekwensu. NUA 173.2

Mgbe oke mkpọchụ iru nke 1844 ahụ gasịrị, Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya nọgịdesịrịke n’ọlụ ise-ọnya dị iche-iche ibibi okwukwe nke nzukọ ahụ. Ọ n’arugịde echiche ọtụtụ madụ ndị mazuru ihe ndịa n’onwe ha. Ha nwere ụdị nke nnweda-n’àlà. Ha gbanwere ozi nke mbụ na nke abụa, n’atụkwa aka n’ọdị-n’iru dịka mgbe ihe ndịa g’emezu, mgbe ndị ọzọ n’atụkwa aka na ihe ndịa e mezuworị n’oge ndị gara aga. Madụ ndịa n’adọpụ uche ndị n’amaghị, na akwatukwa okwukwe ha. Ụfọdụ na enyochakwa akwụkwọ-nsọ na agbali iwuli okwukwe nke onwe ha, n’adabereghị nzukọ. Ekwensu ñụrịrị n’ihe ndịa niile; n’ihi na ọ mara na ndị niile dọkapụrụ onwe ha site na arịlaka ahụ, na ọ pụrụ irugịde site na ọtụtụ nmejọ-ihe ma n’ebụgharikwa ha site n’ifufe nke ozizi dị iche-iche. Ọtụtụ ndị ndu n’oge ozi nke mbụ na nke abụa, gọnarirị ha, nkewa na mgbasasị batakwara na nzukọ. Mgbe ahụ a hụrụ m William Miller. Iru ya gbagọkwara-agbagọ, ma rudatakwa isi ya n’iri-uju na gịgaara nke obi n’ihi ndị ya. Ọ hụrụ ọgbakọ ahụ ndị kekọrọ onwe ha ọnụ na 1844, ka ha n’arapụ ihụnanya ha nweworo n’ime onwe ha, ma n’emegịdekwa onwe ha. Ọ hụrụ ha ka ha danyere n’ime ọjụjụ-oyi, na ọnọdụ nke ndala-azụ. Ọ dara-mba site n’ihe mgbu nke obi. A hụrụ m ndị n’edu edu ka ha nọ n’enyo William Miller, n’atụkwa egwu na o nwere ike ịnabata ozi mụọ-ozi nke atọ ahụ na iwu-iri nke Chineke. Ma dịka o nwara idabere na ihè ahụ nke sitere n’eluigwe, madụ ndịa g’atupụta ụkpụrụ ihe g’adọpụ uche ya. A hụrụ m mgbali nke madụ ime ka uche ya nọgịde n’ime ọchịchịri, na imekwa ka nhukụ ya nọgịde n’etiti ha. Mgbe oge gasịrị William Milller weliri olu ya megide ihè ahụ sitere n’eluigwe. Ọ dara site n’anaraghị ozi ahụ nke pụrụ ikọwara ya n’ozuzu-oke banyere mkpọchụ-iru ya ahụ, na iwakwasikwa ihè n’ebube n’ihe ndị gara-aga, bụ nke pụrụ itute ya site n’ịda-mba ya niile ma wakwasikwa ihè na olileanya ya, ma durukwa ya inye Chineke otuto. Kama ọ dabere na amamihe nke madụ karị nke Chineke, ma n’ihi ike ọgwụgwụ sitere n’oke ndọli n’ọlụ Onyenwe ya, tinyekwara agadi nke o meworo, Ọ bụghị onye a na agụrụ nmejọ ndịa niile dịka ndị ahụ dọpụrụ ya site n’ezi-okwu ahụ. Ndị ahụ ka ọ tụrụ n’isi, nmehie ahụ n’adịkwara ha. Ọ bụru na William Miller hụworo ihè nke ozi nke atọ ahụ, ọtụtụ ihe ndị gbara ọchịchịri dịkwa omimi nye ya k’abụrị ihe a kọwapụtara nye ya. Ụmụnna ya gosipụtakwara ịhụnanya na nmasị dị omimi n’ebe ọ nọ, ọ bụ echiche ya na ya agaghị adọkapụ onwe ya n’ebe ha nọ. Obi ya g’anọgịde n’ezi-okwu ahụ; ma mgbe ahụ ọ n’elekwasi ụmụnna ya anya. Ha a nagịdeghị ya. Ọ ga adọkapụ onwe ya site n’arụ ndị nọ ya n’akụkụ mgbe ha na- ekwusa ọbịbia Jisọs? O chere na ọ dịghị mgbe ha g’eduhie ya. NUA 174.1

Chineke kwere ka ọ banye n’okpuru ike nke Ekwensu, ka ọnwụ nwekwa ike n’arụ ya. Ọ zoro ya n’ime ili, site n’aka ndị nọgịdere idọpụ ya n’aka Chineke. Mosis dahiekwara mgbe ọ fọdụrụ ntakịrị ka ọ banye àlà nkwa ahụ. N’out-aka ahụ kwa, a hụrụ m na William Miller dahiere mgbe ọ fọdụrụ ihe nta ka ọ banye Kenan nke eluigwe, n’ime ka nhukụ ya megide ezi-okwu ahụ. Ndị ọzọ dubara ya na nka. Ndị ọzọ ga azakwa ajụjụ na nka. Kama ndị mụọ-ozi Chineke n’echegịde aja ahụ dị oke ọnụ-ahia nke oru Chineke, na ọ g’apụtakwa n’ụda nke opi ikpeazụ ahụ. NUA 176.1