Ndọndọ Ukuu Ahụ
Isi Nke 3—Atụmatụ Nke Nzọpụta
Iri-uju jupụtara eluigwe, mgbe a hụrụ na madụ efuwo, ọbụna ụwà nke Chineke kere g’abụ ihe jupụtara na ndị n’anwụ anwụ e tinyere na ọnọdụ nhụju-anya, ọria na ọnwụ, ma ọdịghịkwa ụzọ mgbapụ dịrị onye n’emehie ihe. Ezi n’ụlọ Adam niile aghaghị inwụ. A hụrụ m Jisọs ọma ahụ, ma legịdekwa ngosipụta nke obi-ebere na nwute dị n’iru Ya. Na ngwa-ngwa a hụrụ m Ya ka Ọ gara nso ihè ọkụ ukuu ahụ nke n’ekpuchigịde Nna Ya. Mụọ- ozi nke n’eso m wee si, Ọ nọ na nkparịta ụka Ya na Nna Ya. Ọnụnụ-ọkụ nke obi nke ndị mụọ-ozi dịkasịrị elu mgbe Ya na Nna Ya n’akparite ụka. Ugboro atọ ka ihè nke ebube Nna Ya kpuchidoro Ya, ma n’oge nke atọ mgbe O si n’ebe Nna Ya nọ pụta, a hụrụ Ya anya n’ụdị Ya. Iru Ya dị jụụ, nwerekwa onwe ya site n’ihe iju-anya niile na nsogbu, n’enwekwa obi omiko na ihụnanya, n’ụdị nke ọnụ n’apụghị ikọwa. Mgbe ahụ O wee mee ka igwe ndị mụọ-ozi mara na e mepụtawo ụzọ mgbapụ nye madụ furu-efu. Ọ gwara ha na ya nọri n’arịọ Nna Ya arịrịọ, na Ya e werewokwa ndụ Ya nye iji gbapụta, ma narakwa ikpe ọnwụ nye onwe Ya, ka ọ g’abụ na site n’aka Ya, madụ pụrụ ịchọta mgbaghara. Na site na ozuzu-oke nke ọbara Ya na nrube-isi n’iwu nke Chineke, ha g’enweta iru-ọma nke Chineke, wee bụrụ ndị a kpọghachiri n’ogịge ọma ahụ, ma riekwa site na mkpụrụ osisi nke ndụ ahụ. NUA 15.1
Na mmalite ndị mụọ-ozi añurịghị ọnụ, n’ihi na Onye-isi ha ezonarịghị ha ihe ọbụla, kama O kpuheere ha ụkpụrụ nke nzọpụta. Jisọs gwara ha na Ya g’eguzo n’agbata iwe nke Nna Ya na madụ onye ikpe mara, na Ya onwe Ya g’eburu nmehie na ikwa-emo, ọbụna naanị ole na ole g’anara Ya dịka Ọkpara Chineke. Ọ g’afọdụ nke nta ka madụ niile kpọ Ya asị ma jụkwa Ya. Ọ g’arapụ ebube Ya niile n’eluigwe, pụtakwa ihè n’ụwà dịka madụ, wedakwa onwe Ya àlà dịka madụ, Ọ ga ahụzukwa ọnọdụ niile na ọnwụnwa dị iche-iche nke g’agba madụ gburu gburu, na Ọ g’amara otu Ọ g’esi nyere ndị a g’anwa aka; ka ọ g’abụkwa n’ikpeazụ, mgbe O jezuru ozi Ya dịka Onye-ozizi, a g’arara Ya nye n’aka ụmụ madụ, na Ọ g’anagịde nmeso ọjọọ ọbụla na ahụhụ nke Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya g’akpali ndị nmehie itikwasi Ya; ka o wee nwụa ọnwụ kachasị njọ, bụ ikwụdo Ya n’elu dịka onye nmehie ikpe mara; ka O wee hụjue anya ọtụtụ oge-awa nke arụ-ụfụ; nke ọbụna ndị mụọ-ozi n’apụghị ilegịde anya, kama ha g’ekpuchi iru ha site n’ile ọnọdụ dị otua. Ọ bụghị naanị nhụju-anya nke arụ-ụfụ; kama nhụju-anya nke ime-mụọ, nke n’apụghị iji tụnyere nhụju-anya nke elu-arụ. Ibu-arọ nmehie nke ụwà niile g’adakwasi Ya. Ọ gwara ha na Ya g’anwụ ma biliekwa ọzọ n’ụbọchị nke atọ, na Ọ g’arigokuru Nna Ya ịrịọ arịrịọ n’isi madụ kpafuru-akpafu, ikpe mara. NUA 16.1
Ndị mụọ-ozi rudatara onwe ha n’iru Ya. Ha nyere ndụ ha. Jisọs sịrị ha na Ọ g’esite n’ọnwụ Ya zọpụta ọtụtụ madụ; na ndụ otu mụọ-ozi apụghị ikwụ ụgwọ ahụ. Naanị ndụ nke Ya ka Nna Ya pụrụ ịnabata iji gbapụta madụ. NUA 17.1
Jisọs gwakwara ha na ha g’enwe òkè ha g’alụ inọyere Ya, na ịgba Ya ume n’oge dị iche-iche. Na Ọ g’eyiri ọdidị nke madụ dárá-ada, na ike Ya agaghị erukwa ọbụna nke ha. Na ha g’abụkwa ndị àmà nke nweda n’àlà Ya na oke nhụju-anya Ya niile. Na dịka ha g’abụ ndị àmà nke nhụju-anya Ya niile, na nkpọrọmasị ndị madụ nye Ya, ha ga abụ ndị a kpaliri n’ime nwụte dị ukuu, ma site n’ihụnanya ha nwere n’arụ Ya, ha g’achọkwa inapụta Ya, ma zọpụtakwa Ya site n’aka ndị n’egbu Ya; kama na ha anwakwala anwa itinye aka igbochi ihe ọbụla ha g’ahụ; ma ha g’alụkwa òkè ha na mbilite n’ọnwụ Ya; n’ihi na atụmatụ nke nzọpụtaka e meworo, na Nna Ya nabatara atụmatụ ahụ. NUA 17.2
Na nwụte dị nsọ, Jisọs kasịrị ndị mụọ-ozi obi, ma mesaakwa ha iru, ma gwa ha na n’ọdi n’iru ndị ahụ Ọ ga-gbapụta g’anọyere Ya, ma birikwa gbe niile Ya na ha; ma site kwa n’ọnwụ Ya o g’agbapụta ọtụtụ, ma bibiekwa onye ahụ nke nwere ike nke ọnwụ. Ma Nna Ya g’enyekwa Ya àlà-eze ahụ, na ịdị ukuu nke àlà-eze ahụ n’okpuru eluigwe niile, Ya onwe Ya ga enwekwa ya mgbe niile ebighị-ebi. A g’ebibikwa Ekwensu na ndị nmehie, na ha a gaghị esogbukwa eluigwe ozọ, m’ọbụ ụwà ọhụụ ahụ e mere ka ọ dị ọcha. Jisọs mere ka ụsụụ niile nke eluigwe nwe otu-olu na atụmatụ ahụ nke Nna Ya kwenyere, ka ha ñuriakwa na a pụrụ ibuli madụ ahụ nke dárá-ada elu ọzọ site n’ọnwụ Ya, inweta iru-ọma n’ebe Chineke nọ na inwe ọñụ nke eluigwe. NUA 18.1
Mgbe ahụ ọñụ, ọñụ nke ọnụ n’apụghị ikọwa jupụtara eluigwe. Ọbụna ụsụụ ndị eluigwe bụrụ abụ nke otuto na ọjịja-mma. Ha kpatụrụ aka n’ụbọ akwara ha ma fụa abụ dị elu karịa ka ha si eme na mbụ, n’ihi oke obi-ebere na nruda n’àlà nke Chineke n’inye onye Ọ hụrụ n’anya ka Ọ nwụchitere ọgbọ nnupu-isi ọnwụ. Otuto na ọjiịa mma ka a wụsara n’ihi ịjụ onwe-onye na aja nke Jisọs; na Ọ ga ekwenye ịrapụ iru Nna Ya, ma họrọ ndụ nke ịta ahụhụ na ihe mgbu, ma nwụa ọnwụ nke ihere ka O wee nye ndị ọzọ ndụ. NUA 18.2
Mụọ-ozi ahụ sịrị, i chere na Nna nyere Ọkpara Ya Ọ hụrụ n’anya n’enweghị aramahụ? E-e, e-e. Ọ bụkwari ihe oke alịlị n’ezie nye Chineke nke eluigwe, m’ọbụ irapụ madụ ikpe mara ka ọla n’iyi, m’ọbụkwa inye Ọkpara Ya Ọ hụrụ n’anya ka Ọ nwụa n’ihi ha. Ndị mụọ-ozi gosikwara nmasị nke ukuu banyere nzọpụta nke madụ na a pụrụ ihụta ụfọdụ n’ime ha ndị g’arapụ ebube ha, wee nye ndụ ha n’ihi madụ nke na-àlà n’iyi. Kama, mụọ-ozi nke n’edu m sịrị, nka apụghị ilụpụta ihe ọbụla. Nmehie ahụ dị ukuu na ndụ nke mụọ-ozi apụghị ikwụ ụgwọ ya. Ọdighị ihe ọzọ m’ọbụghị ọnwụ na arịrịọ nke Ọkpara Ya g’akwụ ụgwọ ahụ, wee zọpụta madụ nke furu efu site n’iri-uju n’enweghị olileanya, na nhụju-anya kwa. NUA 19.1
Kama ọlụ nke ndị mụọ-ozi ka e kenyekwara ha, irigo na ịrịda n’eweta nkasi-obi nke agbam-ume site n’ebube idozi Ọkpara Chineke n’ime ahụhụ Ya dum, na ijere Ya ozi. Ọzọkwa, ọlu ha g’abụ ichebe na idebe ndị dịrị àmàrà pụa n’aka ndị mụọ-ọjọọ, na ọchịchịrị n’agbagịde ha mgbe niile site n’aka Ekwensu. A hụrụ m na ọ bụ ihe n’enweghị omume ka Chineke megharia mọbụ gbanwee iwu Ya, ka e wee zọpụta onye nfu, na-àlà n’iyi; n’ihi nka O nyere Ọkpara Ya o hụrụ n’anya ka Ọ nwụa n’ihi nmebi-iwu nke madụ. NUA 19.2
Ekwensu ñụrịrị ọñụ ọzọ ya na ndị mụọ-ozi ya na o nwewo ike, site n’ikpata ọdịda nke madụ wee dọdata Ọkpara Chineke site n’ọnọdụ Ya dị elu. Ọ gwara ndị mụọ-ozi ya na mgbe Jisọs g’ewere ọdịdị madụ nke dara-ada, na ya g’akarị Ya ike, ma gbochie nmezu nke atụmatụ nzọpụta. NUA 20.1
Mgbe ahụ e gosịrị m Ekwensu ka o diworo na mbụ, n’obi ụto, dịka mụọ-ozi e buliri-elu. E wee gosikwa m ka o sịrị dị ugbua. Ọ nọ n’adikwa n’oyiyi nke onye-eze. Ọ nọ n’enwekwa ụdị kwesịrị nsọ, n’ihi na ọ bụ mụọ-ozi dara-ada. Kama ihe iru ya n’egosi jupụtara n’oke echiche, ndọlị, obi- ọjọọ, anya-ụfụ, ikpọ-asị, arụrụ-àlà, aghụghọ na ihe ọjọọ niile. Iru ahụ nke a n’asọpụrụ asọpụrụ na mbụ, eletara m ya. Mbara iru ya, malitere n’anya ya abụa laa azu. A hụrụ m na ọ kwaruwo onwe ya n’ogologo oge ndịa, na ihe-ọm’ọbụla nke dị ya n’arụ atalatawo, ma mkpụrụ ọjọọ ọbụla e pulitewo. Anya ya abụa nwere izu dị omimi, dịkwa aghụghọ, n’egosikwa oke nleru anya. O nwere arụ dị obosara, kama na anụ-arụ yọkọrọ-ayọkọ gburu-gburu aka ya abụa na iru ya. Dịka m legịdere ya anya, ọ dụnyere aka ekpe ya n’agba. Ọ dị ka onye nọ n’oke echiche. Ọnụ-ọchị dịkwa n’iru ya, nke mere ka m tụa egwu, o jupụtara na ihe ọjọọ na aghụghọ Ekwensu. Ọ bụ ọnụ-ọchị a ka ọ n’eyiri mgbe ọ n’abiakute onye ọ n’emegbu, ma dịka ọ n’ekechi onye ọ n’amata nọnya, ọnụ-ọchi a n’aghọ ihe iyi-egwu. NUA 20.2