Ndọndọ Ukuu Ahụ

21/42

Isi Nke 20—Nmegharị Ihe Ahụ

Ma n’agbanyeghị nkpagbu niile na ogbugbu nke ndị nsọ, kama ndị-àmà dị ndụ ka a kpọlitere n’aka ndị ọbụla. Ndị mụọ-ozi nke Chineke nọgịdekwara n’ọlụ nke e nyere ha n’aka ịlụ. Ha nyochara n’ebe niile gbara ọchịchịri, na arọpụtakwa site n’ọchịchịri, ndị ikom ndị nwere ezi-okwu n’ime obi ha. Ha niile bụkwaara ndị e liri-eli n’ime okwu ụgha, ma otu ọdị Chineke họkwaara ha dịka o mekwara Sọl, dịka ụgbo nke g’ebu ezi-okwu ya, ma welie olu ha megide nmehie niile nke ndị kpọrọ onwe ha ndị nke ya. Ndị mụọ-ozi nke Chineke kpaliri Martin Luther, Melenthon, na ndị ọzọ n’ebe dị iche-iche, akpịrị ikpọ ha nkụ banyere àmà ahụ dị ndụ nke okwu Chineke. Onye iro a batawọkwari dịka oke iju miri, ma a ghaghị ibuli ogo nke ọnọdụ elu megide ya. Ọ bụkwa Luther ka a rọpụtara imenyụ oke-ifufe a, na ibili medgịde omume nke nzukọ dara-ada, na ịgba ha ume bụ madụ ole na ole ndị kwesịrị ntụkwasị-obi na okwukwe ha dị nsọ. Ọ n’atụkwa egwu mgbe niile ka ọ rapụ imehie megide Chineke. Ọ gbalịrị ịlụsi ọlụ ike ka o nweta iru-ọma nke Chineke; kama ọdịghị mgbe o nwetara ojuju-afọ rue mgbe ihe nke sitere n’eluigwe chụpụrụ ọchịchịri site n’obi ya, ma durukwa ya ịtụkwasị obi, ọ bụghị n’ọlụ dị iche-iche, kama n’izu-oke nke ọbara Kraist; na ibikute Chineke n’onwe ya, Ọ bụghịkwa site na ndị Pop m’ọbụ ndị n’ekwupụta nmehie, kama site naanị n’aka Jisọs Krasit. O! lee ka ọ dị oke ọnụ-ahia bụ amamihe nka nye Luther! Ọ bụ ihe dị oke ọnụ-ahia nye ya bụ ihè ọhụụ nka nke wakwasịrị nghọta ya gbara itiri, nke chụpụkwara ịsụ ngọngọ ya niile, dịkwa elu karị akù niile nke elu ụwà. Okwu Chineke diwakwara ọhụụ. Ihe niile ka a gbanwekwara. Akwụkwọ ahụ nke ọ tụworo ụjọ ya n’ihi na ọ hụghị ima-mm’ọbụla n’ime ya, bụrụ ndụ. Ndu n’ezie nye ya. Ọ bụkwara ọñụ nye ya, bụrụkwa nkasi-obi ya, na onye ozizi ya a gọziri agọzi. Ọ dịghịkwa ihe pụrụ ime ka ọ rapụ imụ ya. Ọ tụwori egwu ọnwụ; ma ka ọ na agụ okwu Chineke ahụ, ihe egwu niile pụrụ ya n’anya, o wee nwee nmasị n’agwa Chineke, ma hụkwa ya n’anya. O nyochkwara okwu Chineke n’onwe ya. O rijukwara afo site n’iba-ụba nke ihe ọma jupụtara n’ime ya, mgbe ahụ o wee nyochaakwa ya n’ihi nzukọ. Ike gwụrụ ya nke ukuu banyere nmehie niile nke ndị ahụ ọ tụkwasiworo obi n’ihi nzọpụta. Ọ hụrụ ọtụtụ ndị e kpudeworo n’ime ọchịchịri ahụ nke kpugịdewọkwara ya onwe ya. O wee were ọnụ-ọkụ n’obi chọ ohere ọ g’eji tụrụ ha aka nwatụrụ nke Chineke, onye naanị ya na ebupu nmehie nke ụwà. O wee welie olu ya megide okwu ụgha niile na nmehie niile nke nzukọ Pop, n’achọsikwa ike idọbi ụdọ nke ọchịchịri ahụ nke jigịdere nnụkuru nnụ madụ, n’emekwa ka ha tụkwasị obi n’ọlu n’ihi nzọpụta. Ọ kpàrà ya nkpa inwe ike imehe ya na akọ-n’uche ha bụ ezi akụ n’ụba nke amara nke Chineke, na ima-mma nke nzọpụta enwetara site n’aka Jisọs Kraist. O jiri inụ-ọkụ n’obi welie olu elu, ma sitekwa n’ike nke Mụo-nsọ, n’etikwa mkpu megide nmehie niile nke ndị ndu nke nzukọ; ma ka o zutere oke-ifufe nke ima aka n’iru nke ndị nchụ-àjà, nkwam’ike ya a daghịkwa; n’ihi na ọ dabere n’aka dị ike nke Chineke, ma nweekwa ntụkwasị-obi sịrị ike na ya rue nmeri. Ọbụna mgbe ọ n’ebu agha ahụ n’agaru nsọ, iwe ndị nchụ-aja kpaliri megide ya. Ha a chọghịkwa ka e wụgharia ha. Ọchịchọ ha bụ inọgịde na ndụ dị mfe, n’ime ihe ụtọ, na ajụọ-omume. Ha chọro ka nzukọ nọgịde n’ọchịchịri. NUA 122.1

A hụrụ m na Luther nwere ọnụ-ọkụ n’obi, nwekwa nkwụwà-okwu, n’adịghị atụ ụjọ ịta nmehie ụta, n’agbakwara ezi-okwu ahụ àmà. O leghị ndị nmebi-iwu na ndị mụọ-ọjọọ anya n’iru. Ọ matara na o nwere otu onye nọyeere ya nke dị ukuu karị ha niile. Luther nwere ire-ọkụ, ọnụ-oku nke obi, ike na agbazara-anya, n’agabigakwa oke na oge ụfọdụ; ma Chineke kpọlitere Melancthọn, onye agwa ya dị iche, ka onyere Luther aka, n’iburu ọlụ nke nmegharị ihe ahụ n’aga n’iru. Melancthon dị nwayo, n’atụ ụjọ dịkwa nkpacharanya ma nwekwa oke obi-ndidi. Ọ bụ onye Chineke hụrụ n’anya nke ukuu. O nwere amamihe nke akwụkwọ-nsọ ri nne, akọ-n’uche ya na izù ya makwara ezi mma. Ihụnanya o nwere n’ozi nke Chineke dịkwa ka nke Luther. Obi ndịa, ka Onyenwe-anyị dụkọtara otu; ha ghọrọ enyi nke n’adịghị ekewa-ekewa. Luther bụụrụ onye inye-aka dị ukuu nke Melancthọn mbge ọ nọrọ n’ihe ọghọm nke ịtụ ụjọ na ọlịla-azu, ma Melancthọn bụkwaara onye inye-aka dị ukuu nke Luther n’igbochi ya ka ọ ghara ijekarị ngwa-ngwa n’omume ya. Nleru-anya nke Melancthọn na nkpacharanya ya ọtụtụ mgbe gbochiri nsogbu nke gaara emebi ihe, ma asi na a rapụrụ ọlụ ahụ naanị n’aka Luther; ma ọlụ ahụ kadakwa ri ọtụtụ mgbe, n’adịghịkwa a ga n’iru ma asị na a rapụrụ ya naanị n’aka Melanchthon. E gosịrị m amamihe nke Chineke n’ihọrọ ndị ikom abụa ndịa, nke nwere agwa dị iche-iche iburu ọlụ nke nmegharị ihe a. NUA 125.1

Mgbe ahụ e kuuru m laghachi azụ rue n’oge nke ndị-ozi, ma hụkwa na Chineke họọrọ dịka ndị na alụkọ ọlụ, Pita, onye nwere ọnụ-ọkụ n’obi siekwa ike na Jọn onye dị nwayo n’obi nwekwara ndịdi na obi dị ume-àlà. Mgbe ụfọdụ Pita n’enwe obi-oku. Ma onye ahụ a hụrụ n’anya n’abianyụ Pita mgbe omume gara-gara ya n’eduru ya gafee oke; kama nka tụgharighị omume ya. Kama mgbe Pita gọnarịsịrị Onyenwe-ya ma cheghariakwa, ma bụrụkwa onye e mere ka o chigharia, naanị ihe o chọrọ bụ ndụmọdụ dị nro site n’aka Jọn ịbianyụ omume ọkụ-ọkụ ya. Ozi nke Kraist gaara enwe nkpọchụ-iru ma a sị na a rapụrụ ya naanị n’aka Jọn. A chọkwara omume ọkụ-ọkụ nke Pita. Agbazara anya ya na ike ya napụtara ha ọtụtụ mgbe site na nsogbu, ma mechiekwa ndị iro ha ọnụ. Jọn n’emerikwa mgbe niile. O ritere ọtụtụ madụ n’uru nye Kraist site na ntachi-obi ya, nnagịde na ịlụsi ọlụ ike ya. NUA 126.1

Chineke kpọlitere ndị g’eti mkpu megide nmehie nke nzukọ Pop, ma burukwa ọlụ nmegharị ihea gaa n’iru. Ekwensu chọro ụzọ ịla ndị-àmà ndịa n’iyi; kama Chineke gbara ha ogịge gburu-gburu. Ụfọdụ, n’ihi otuto nke áhà Ya, ka e kwere ka ha were ọbara ha ka ezi àmà ha gbara akara; kama ndị ikom ọzọ dị ike dịkwa , ndị dịka Luther na Melancthon, ndị gbalisịrị ike inye Chineke otuto site na ịdị ndụ na etisikwa nkpu ike megide nmehie niile nke ndị Pop, ndị nchụ-àjà na ndị-eze. Ha tụrụ egwu olu Luther. Site n’aka ndị ikom ndịa a ropụtaworo, ihè malitere ịgbasasị ọchịchịri, ma ọtụtụ madụ ji obi-ụtọ nara ihè ahụ ma jekwa ije n’ime ya. Ma mgbe e gburu otu onye-àmà , ndị àmà abụa ọzọ m’ọbụ karị ka a kpolitekwara ịnọchi ọnọdụ ya. NUA 126.2

Ma nka ejughị Ekwensu afo. Ọ pụrụ inwe ike megide naanị anụ-arụ. Ọ pụghị ime ndị kwere ekwe ka ha rapụ okwukwe na olileanya ha. Ọbụna n’ọnwụ ha n’emerikwa n’ihe nke olileanya ndụ anwụghị-anwụ na nbilite n’ọnwụ nke ndị ezi-omume. Ha nwererị ihe karịrị ike nke anụ-arụ. Ha adịghịkwa a rarụ ụra ọbụna otu oge. Ha n’ejikwa onwe ha n’ihe-agha nke ndị nke Kraist, n’ejikerekwa ọgụ, Ọ bụghị naanị ọgụ ha na ndị iro nke ime-mụọ, kama ọgụ ha na Ekwensu n’odịdị ụmụ madụ, ndị n’etiku ha mkpu mgbe niile, n’asi, rapụ nụ okwukwe unu m’ọbụ unu a nwụa. Ndị nke Kraist ole na ole ndịa siri-ike n’ime Chineke, ma dịkwa oke ọnụ-ahia n’anya ya karị ọkàrà ndị ụwà niile n’akpo áhà Kraist, ma bụrụ ndị n’atụ ụjọ n’ozi ya. Ọbụna mgbe a na akpagbu nzukọ, ha dịrị n’otu nwekwa ihụnanya. Ha sịrị ike n’ime Chineke. E nyeghị ndị nmehie ohere igwakọ onwe ha na nzukọ ahụ, ma onye nduhie ma onye a n’eduhie. Naanị ndị ahụ jikere irapụ ihe niile n’ihi Kraist pụrụ ibụ ndị n’eso ụzọ ya. Ha nwere nmasị ibu ogbenye, ndị e wedara n’àlà na ndị dịka Kraist. NUA 127.1