Ndọndọ Ukuu Ahụ
Isi Nke 13—Ọnwụ Nke Stiven
Ndị n’eso ụzọ ya mụbara nke ukuu na Jerusalem. Okwu Chineke gakwara n’iru, ọbụna ọtụtụ ndị nchụ-àjà rubere okwukwe a isi. Stiven, onye jupụtara n’okwkwe, lụrụ oke ọlụ-ebube dị ichde-iche na ọtụtụ ihe iribama n’etiti ndị madụ. ọtụtụ madụ were iwe; n’ihi na ndị nchụ-àjà n’echeghari site na omenàlà ha, na sitekwa na ọchụchụ-aja na onyinye ha dị iche-iche, ma n’anarakwa Jisọs dịka àjà ukuu ahụ. Stiven, site n’ike nke eluigwe, tara ndị nchụ-àjà na ndị okenye ụta, ma buliekwa Jisọs elu n’iru ha. Ha a pụghịkwa iguzogịde amamihe na ike ahụ nke o ji ekwu okwu, ma mgbe ha hụrụ na ọdịghi ihe ha pụrụ ime megide ya, ha zụrụ ndị g’agba àmà -ụgha megide ya na ha nụrụ mgbe ọ n’ekwulu megide Mosis ma megịdekwa Chineke. Ha kpaliri ndị madụ, ma dọkpụrụkwa Stiven, ma, sitekwa n’ọnụ ndị àmà-ụgha, ha boro ya ebubo ikwugịde ụlọ-nsọ na iwu. Ha gbara àmà na ha a nuwo ri mgbe ọ n’asị na Jisọs onye Nazaret g’emebi omenàlà ha nke Mosis nyere ha. NUA 86.1
Ndị niile nọdụrụ àlà n’oche-ikpe megide Stiven hụrụ ihe nke ebube Chineke n’iru ya. Iru ya nwụpụrụ ihè dịka iru nke mụọ-ozi. O biliri ọtọ jupụtakwa n’okwukwe na Mụo-nsọ, ma, sitekwa `na ndị-amụma, ọ kowapụtara ha rue oge ọbịbịa Jisọs, ọnwụ nke obe Ya, nbilite n’ọnwụ na nlaghachi eluigwe ya, ma gosikwa ha na Onyenwe-anyị e bighị n’ụlọ e ji aka wue. Ha fere ụlọ nsọ ofufe. Ihe ọbụla e kwuru megide ụlọ nsọ ha n’agbajupụta ha n’iwe nke ukuu karị nke a sị na ekwugịdere Chineke. Mụọ nke Stiven ka a kpasuru site n’iwe nke eluigwe mgbe o tiri nkpu megide ha n’ihi omume ọjọọ ha, na ebighị-ugwu nke obi ha. Unu n’emegịde Mụo-nsọ mgbe niile. Ha n’edebe iwu niile nke omenàlà, mgbe obi ha jupụtara n’ọrụrụ, na ihe ọjọọ dị iche-iche. Stiven kpotụrụ uche ha ga na nmehie nke Nna ha n’ikpagbu ndị amụma, na asi ha, unu egbuwo ha bụ ndị gosiworo ihe banyere ọbịbịa nke Onye ezi-omume ahụ, nke unu onwe unu bụkwa ndị rara ya nye ma gbuekwa ya. Ndị isi nchụ-àjà na ndị ọchịchị ka a kpasuru iwe, mgbe e kwupụtara ezi-okwu ahụ n’ụzọ pụtara ihè; ma ha gbara ọsọ dakwasị Stiven. Ihè nke eluigwe wakwasịrị ya, ma dịka o weliri anya ya elu lekwasi eluigwe, e nyere ya ọhụụ nke ebube Chineke, ka ndị mụọ-ozi na erụghari kwa gburu-gburu ya. O wee tie-mkpu n’oke-olu sị, lee, a nam’ahụ ka e mehere eluigwe na nwa nke madụ na eguzokwa n’aka nri nke Chineke. Ndị ahụ a chọghị inụ ihe o n’ekwu. Ha tipụrụ mkpu n’oke-olu, mechikwa nti ha, ma gbakuru ya n’otu, wee tụpụ ya n’azu obodo ma tụa ya nkume. Stiven wee gbue ikpèrè n’àlà, tie mkpu n’oke-olu sị, Onyenwe-anyị, atụkwasịla nmehie nka n’isi ha. NUA 87.1
A hụrụ m na Stiven bụụrụ onye dị ike nke Chineke, nke a kpọlitere n’ụzọ pụrụ iche imejupụta ọnọdụ dị mkpa n’ime nzuko. Ekensu ñụrụ ọñụ nmeri mgbe a tugburu ya na nkume; n’ihi na ọ matara na ndị n’eso ụzọ Jisọs g’eri uju nke ukuu na nfu dị otua. Ma ọñụ nmeri nke Ekwensu dịịrị mkpirimkpi; n’ihi na otu onye n’eguzo nọgbakọ ahụ, nke n’elegịde ọnwụ Stiven, onye Jisọs g’ekpuhere onwe Ya. Ọbu ezie na o tinyeghị aka n’itụ Stiven nkume, kama o kwenyere n’ọnwụ ya. Sọl nwere ọnụ-oku n’obi n’ikpagbu nzukọ Chineke, n’achụ ha, n’ejidekwa ha n’ụlọ ha dị iche-iche, n’enyefekwa ha na ndị g’egbu ha. Ekwensu jiri Sọl n’alu ọlụ pụtara ihè. Kama Chineke pụrụ ibibi ike Ekwensu, ma tọpụkwa ndị niile Ekwensu dubara n’agbu. Sọl nwere ezi nmụta, ma Ekwensu ji nmeri n’etinye amamihe ya niile n’ọlụ iji nye aka na omume nke nnupu-isi ya megide Ọkpara Chineke, na ndị niile kwere na ya. Kama Jisọs họọrọ Sọl dịka ụgbọ eji ekwusa áhà Ya, iji gbaa ndị n’eso ụzọ Ya ume nọlụ ha, na karịkwa idochi ọnọdụ Stiven. Sọl bụ onye dị ukuu n’anya ndị Juu. Ọnụ-ọkụ nke obi ya na nmuta ya dị ha mma, ma bụrụkwa ihe egwu nye ndị n’eso ụzọ ya. NUA 88.1