Ndọndọ Ukuu Ahụ
Isi Nke 10—Nbilite N’ọnwụ Nke Kraist
Ndị n’eso ụzọ ya zuru ike n’ụbọchị-izuike, n’eri uju n’ihi ọnwụ nke onyenwe ha, mgbe Jisọs, Eze nke ebube, zukwara ike n’ili. Abali ejiriwo nwayọ gabiga, ma mgbe ọchịchịri ka dị n’isi-ututu, ndị mụọ-ozi na erụgharị gburu-gburu ili ahụ makwara na oge ịkpọpụta Ọkpara Chineke, Onye-isi ha, a biaruwo nso. Ma ka ha ji obi ọnụnụ ọkụ dị omimi na echere oge awa nke nmeri ya, otu mụọ-ozi nke dịkarị ike dịkwa ukuu fedatara n’otu ntabi-anya site n’eluigwe. Iru ya dịkwa ka ihe na enwụ enwụ, uwe ya dịkwa ọcha dịka sno. Ihè ya wakwasịrị ọchịchịri nke dị n’ụzọ ya, ma meekwa ka ndị mụọ-ọjọọ niile ahụ ndị n’akoro arụ Jisọs na nmeri ha, gbalagasia n’itu egwu n’ihi oke igbu marà-mara ya n’ebube. Otu nime ụsụụ ndị mụọ-ozi hụrụ nweda nàlà na nkparị niile a kparaịrị Jisọs, nke n’echegịdekwa ebe izuike ya dị nsọ, soro mụọ-ozi uku ahụ sitere n’eluigwe, ha wee biarue n’ili ahụ. Ala mara jijiji meekwa nkpọtu ka ha na abiaru nso, oke àlà-ọma jijiji wee dị. Mụọ-ozi ukuu ahụ dị-ike jidere nkume ahụ ma wepụkwa ya ngwa-ngwa site n’ọnụ-ili ahụ ma nọrọkwa ọdụ n’elu ya, NUA 63.1
Oke ụjọ dakwasịrị ndị-che. Ole ebe ike ha dị ugbua ichebe arụ Jisọs? Ha e cheghikwa banyere ọlụ ha, m’ọbụ ndị n’eso ụzọ Jisọs izuru arụ ya n’ori. Ọ tụrụ ha n’anaya nke ukuu ma tinyekwa ha ụjọ n’aru, ka ihè ahụ nke sitere n’aru ndị mụọ-ozi wakwasịrị gburu-gburu ebe nile karịa ihe anyawu. Ndị-nche nke ndị Rom hụrụ ndị mụọ-ozi ahụ, wee daa dịka ndị nwụrụ-anwụ. Otu onye mụọ-ozi wepụrụ nkume ahụ n’ike nke nmeri, ma sitekwa n’oke-olu a nụrụ nke ọma tie mkpu sị Gị Ọkpara nke Chineke! Nna Gị n’akpọ Gị! Pụta! ọnwụ enweghịkwa ike n’aru ya ọzọ. Jisọs bilitere site n’ọnwụ. Mụọ-ozi nke ọzọ ahụ wee banye n’ime ili ahụ, ka ọ n’ebili na nmeri, o we tọpụ ya akwa niile e kere ya, Jisọs wee je ije pụta dịka onye meriri emeri. Site n’itu-egwu dị nro igwe ndị mụọ-ozi lekwasịrị ọnọdụa anya. Ọbụna mgbe Jisọs si n’ili n’azọpụta ụkwụ n’ịdị ukuu Ya, mụọ-ozi ndịa niile n’egbu marà-mara rudatara onwe ha nàlà wee fee ya ofufe; ma tookwa ya site n’abu nke nmeri, na ọnwụ apụghị ijidekwa Nwa nke Chineke ọzọ. Ekwensu e merighịkwa ugbua. Ndị mụọ-ozi nke ya a gbalagasiwori n’ihi oke ihè ahụ, nke chawara site na ndị mụọ-ozi nke eluigwe. Ha mere nkpesa dị ilu nye eze ha, n’asi na a punariwo ha onye ha ji n’ike, na onye ahụ nke ha kpọkwara asi e siwo n’ọnwụ bilie. NUA 64.1
Ekwensu na ndị mụọ ozi ya a ñuriwo ọñụ nke nmeri na nwoge nta n’ihi na ike ha megide madụ nke dárá-ada e mewo ri ka onyenwe ndụ, bụrụ onye e liri nàlà-ili; kama ọñụ nke ajụọ nmeri ha dịrị mkpirimkpi. N’ihi na mgbe Jisọs pụtara site n’ụlọ nkpọrọ ya dịka onye eze meriri emeri, Ekwensu matara na mgbe nwa-oge gasịrị ya onwe ya aghaghị ịnwụ, na àlà-eze ya g’agafere onye ahụ o ziri ezi inwe ya. Ọ kwara arịrị n’oke iwe na n’agbanyeghị mgbalị ya niile na ike ya, Jisọs abụghị onye e meriri emeri, kama o mehewo ụzọ nke nzọpụta nke madụ, na onye ọbụla nke n’achọ, pụrụ ije-ije na ya ma nwe nzọpụta. NUA 65.1
Na nwoge nta, Ekwensu nọdụrụ na nwụte n’egosikwa ida-mba. O wee nwee nzụkọ ya na ndị mụọ-ozi ya itu-ero ihe ha g’etinye aka na y-a ọzọ imegịde ọchịchị nke Chineke. Ekwensu sịrị, unu aghaghị ime ngwa-ngwa jekuru ndị isi nchụ-àjà na ndị okenye. Anyị meriri n’iduhiè ha na imechi anya ha, na imesi obi ha ike megide Jisọs. Anyị mere ka ha kwenye na ọ bụ onye-nduhie. Ndị-agha Rom ahụ n’eche nche g’eburu akụkọ ọjọọ ahụ na kraist ebiliwo. Anyị duru ndị nchụ-àjà na ndị okenye ikpọ Jisọs asị na igbu ya. Ugbua aghaghị ime ka ọ pụta ihiè n’anya ha, na n’ihi na ọbụ ha gbụrụ ya, ọbụrụ na a mata nke ọma na Jisọs ebiliwo, ndị madụ ga atugbu ha na nkume, n’ihi na ha gburu onye aka ya dị ọcha. NUA 65.2
Ka igwe ndị mụọ-ozi ahụ laghachiri n’eluigwe, ka ihè na ebube ahụ gabigakwara, a hụrụ m ndị nche Rom ahụ ka ha palitere onwe ha ịmata ma ọ g’adịrị ha mfe ilegharị anya gburu-gburu ha. O juru ha anya nke ukuu mgbe ha hụrụ na e bupuwo oke nkume ahụ site n’ọnụ ili, na Jisọs e biliwọkwa. Ha mere ngwa-ngwa jekuru ndị isi nchụ-àjà na ndị okenye ịkọrọ ha ihe-ebube ahụ nke ha hụrụ; ma mgbe ndị ogbu-madụ ahụ nụrụ akụkọ a dị ebube, iru ha manwụrụ-amanwụ. Oke ụjọ biakwasịrị ha n’ihi ihe ha meworo. Ha matara mgbe ahụ na ọbụrụ na akụkọ nka bụ ezie, na ha a bụwo ndị furu efu. Na nwa oge nta ha dara iberibe, ma lekọrite onwe ha anya, derekwa duu, n’amaghị ihe ọbụla ha ga eme m’ọbụ ikwu. E dotere ha n’ọnọdụ ha n’apụghị ikwenye karịkwa naanị ima onwe ha ikpe. Ha pụrụ ezi ịgba izu nime onwe ha ihe ha g’eme. Ha kpebiri na ọbụrụ na a gbasara ya n’obodo ndị ọzọ na Jisọs ebiliwo, ọbuna akụkọ nke ihe oke ebube dị otua, nke mere ndị nche ida dịka ndị nwụru-anwụ, ga eru ndị madụ nti, a ghaghị ikpali ha oke iwe nke g’eme ka ha buso ha agha, ma gbue ha. Ha kpebiri izụrụ ndị-nche ahụ ka ha kpuchie okwu ahụ na nzụzo. Ha kwere ha ego buru ibu, n’asi ha, kwue nu na ndị n’eso ụzọ ya biara n’etiti abali wee zuru arụ ya mgbe anyị n’ararụ ụra. Ma mgbe ndị nche ahụ jụrụ banyere ihe a g’eme ha dịka ndị n’ararụ ụra noge ọlụ ha, ndị nchụ-àjà ahụ na ndị okenye kwuru na ha g’arụgịde onye-ọchịchị ma zọpụtakwa ha n’aka ya. N’ihi ego ndị nche ahụ rere ùgwù ha ma kwenyekwa isoro ndụmọdụ nke ndị nchụ-àjà na ndị okenye. NUA 66.1
Mgbe Jisọs nọ n’elu-obe, tipụ mkpu si, o gwuwo, nkume gbawara, àlà makwara jijiji ọbụna ụfọdụ àlà-ili kwahere; n’ihi na mgbe Jisọs biliri n’ọnwụ, ma merie ọnwụ na ili; mgbe Ọ pụtara site n’ụlọ-nkpọrọ ya dịka onye meriri emeri; ọbụna mgbe ụwà na akwa eneke, n’eme mkpọtụ, n’ebube niile na ịdị mma nke eluigwe jupụtara gburu-gburu ebe ahụ dị nsọ, na nrube-isi nye ọkpụkpọ ya, ọtụtụ ndị ezi-omume nwụru-anwụ pụtara dịka ndị àmà na o biliwori. Ndị ahụ uru a tụrụ, ndị nsọ sitere n’ọnwụ bilie pụtara n’ụdị dị-ebube. Ha dị ole na ole arọpụtara dị nsọ bụ ndị biworo ndụ n’ọgbọ niile sitekwa n’okike ụwà rue n’oge nke kraist. Ma ọbụna mgbe ndị nchụ-àjà na ndị farisii n’achọ ụzọ ikpuchi nbilite n’ọnwụ nke Kraist, Chineke họọrọ ikpọlite nzukọ site n’ili ha ịgba-àmà na Jisọs ebiliwo ri, na ikwupụta ebube ya. NUA 67.1
Ndị ahụ e mere ka ha si n’ọnwụ bilie nwere ọdịdị arụ dị iche-iche. E mere ka m mara na ndị bi n’elu ụwà nọ na atalata atàlàta, na etufu ume na ima-mma ha. Ekwensu nwere ike nke ọrịa na ọnwụ, ma nọgbọ ọbụla, ọbụbụ-ọnụ a n’apụtakasi ihè, ike nke Ekwensu ka a na ahuzukwa na ya. Ụfọdụ ndị e mere ka ha bilie gbara dimkpa n’anya karịa ndị ọzọ. A gwara m na ndị biri ndụ n’oge Noa na Abraham bụ ndị karịrị n’inwe ọdịdị nke ndị mụọ-ozi, na ima mma na ịdị ike. Kama ọgbọ ọbụla n’atalata-atàlàta n’enwekwa ọrịa dị iche-iche, ndụ ha n’ebilatakwa nkpirimkpi. Ekwensu nọgịdere na amuta otu esi akpasu ndị madụ iwe, n’emekwa ka ndị niile n’ada mba. NUA 67.2
Ndị nsọ ahụ ndị pụtara mgbe mbilite n’ọnwụ Jisọs gasịrị mekwara ka ọtụtụ madụ hụ ha, n’agwakwa ha na àjà a chụrụ n’isi madụ ezuwo oke, na Jisọs, onye ndị juu kpọgịdere n’obe e siwo na ndị nwụrụ-anwụ bilie, na ekwukwasikwa na, anyị onweanyị sokọrọ ya bilie. Ha nwere ọgbụgba-àmà na o bụ site n’ike ya dị ukuu ka a kpọlitere ha site n’ili ha. N’agbanyeghị àmà ụgha niile nke e kesara, okwu ahụ ka a n’enweghị ike ikpuchi-ekpuchi site n’aka Ekwensu, ndị mụọ-ozi ya m’ọbụ, ndị isi nchụ-àjà ; n’ihi na agbako ndị nsọ ahụ, a kpolitere site nili ha, gbasara ozi a dị ebube, dịkwa oke-ọnụ; ọbụna Jisọs gosikwara onwe ya nye ndị n’eso ụzọ ya na eri-uju, n’obi-ntiwa, n’ewezuga ụjọ ha, n’emekwa ha obi-ụtọ na añuri. NUA 68.1
Ka ozi a n’agbasa site n’obodo rue n’obodo, ruekwa n’àlà ndị ọzọ dị iche-iche, ndị Juu n’onwe ha nwere ụjọ banyere ndụ nke ha, wee kwachie obi ikpọ-asi ha nwere n’ebe ndị n’eso ụzọ Kraist nọ. Olileanya ha dabeere naanị n’ịgbasa àmà-ụgha nke ha. Ma ndị chọkwara ka àmà -ụgha nka bụrụ ezi-okwu, kwenyekwara na ya. Pailet tụrụ egwu nke ukuu. O kwenyere n’ezi-àmà ahụ dị-ike e nyere, na Jisọs e siwo na ndị nwụrụ-anwụ bilie, na ọtụtụ ndị ọzọ ọ kpọliteworo, o nweghịkwa udo n’ime onwe ya ọzọ ebighị-ebi. N’ihi ùgwù nke elu-ụwà; n’ihi itụ-ụjọ ka ọ ghara itufu ikike-ọchịchị ya, na ndu ya, onyefere Jisọs ka ọ nwụa. E mewo ugbua ka o wee ya anya na ọ bụghị naanị madụ efu, aka ya dị-ọcha ka ikpe ọbara ya mara ya kama ọbara nke Ọkpara Chineke. Ndụ Pailet banyere ọnọdụ ọjọọ; ọbụna rue ogwụgwụ ya. Ida mba na obi-ntiwa kpagburu olile anya ya ọbụla, m’ọbụ obi-ụtọ ya ọbụla. Ọ jụrụ ịnara nkasi-obi, ma nwụakwa ọnwụ nke jọkarịrị njọ. NUA 68.2
Obi nke Herọd n’onwe ya biara sie-ike karịa na ọbụna mgbe o nụrụ na Jisọs ebiliwo nọnwụ, o nyeghịkwa ya nsogbu nke ukuu. O wepụrụ ndụ Jems; mgbe ọ hụkwara na nka masịrị ndị juu, o wee jidekwa Pita, burukwa n’obi igbu ya. Kama Chineke nwere olu Pita g’alụ,wee ziga mụọ-ozi ya ịgbapụta ya. Ikpe nke Chineke letara Herọd. Chineke tigburu ya niru igwe madụ mgbe ọ na ebuli onwe ya elu n’iru ha, o wee nwụa-ọnwụ jọgburu onwe ya na njọ. NUA 69.1
N’isi ụtụtụ uku mgbe ihè n’akadịghị, ndị inyom ndịa dị nsọ biaruru ili ahụ, n’eweta ude ụtọ ha ite arụ Jisọs, ma lee! Ka ha hụrụ na e bupụwo ri nkume uku ahụ site n’ọnụ ili ahụ, ma arụ Jisọs anọghịkwa n’ebe ahụ. Obi wụnyere ha n’afọ, ha chekwara na ndị iro ha e bupụwo arụ ya. Ma lee, ndị mụọ-ozi abụa na eyikwa uwe-nwụda ọcha ha na eguzo n’akụkụ ha; iru ha chapụrụ na enwụkwa enwụ. Ha matakwara ozi nke ndị inyom ndia dị nsọ, wee gwa ha otu mgbe ahụ na ha n’achọ Jisọs, kama na o nọghị n’ebe ahụ, na o siwọkwa nọnwụ bilie, na ha pụrụ ilekwa anya n’ebe o dinaworo. Ha gwara ha ka ha gaa gwa ndị n’eso ụzọ ya na o ga ebu ha ụzọ jerue na Galili. Ma ndị inyom ahụ tụrụ egwu nke ukuu. Ha wee gba ọsọ jekuru ndị n’eso ụzọ ya ndị nọ n’iri uju, n’apụghị inara nkasi-obi n’ihi na a kpọgịdewo onye nwe ha n’obe; ha mere ngwa-ngwa n’ikọrọ ha ihe niile ha hụrụ ma nụkwa. Ndị n’eso ụzọ ya e kwenyeghịkwa na o siwo n’ọnwụ bilie, kama, ha sokọrọ ndị inyom ahụ wetara ozi ahụ, wee gbaa ọsọ rue n’ili, ma hụkwa n’ezie na Jisọs a nọghịkwa n’ebe ahụ. Nebe ahụ ka akwa ọcha ya tọgbọrọ, kama ha e kwenyeghị ozi ọma ahụ na Jisọs e biliwo site na ndị nwụrụ-anwụ. Ha laghachiri ụlọ n’enwe oke itụ-n’anya nihe ndịa ha hụworo, na ozi ahụ nke ha nwetara site n’aka ndị inyom ahụ. Ma Meri nọgịdere n’ogịge ili ahụ, na eche ihe o hụworo,n’enwekwa ida mba nke echiche-obi na eleghị anya na e duhiewo ya. O chere na ọnwụnwa ọhụụ ndị ọzọ n’echerekwa ya. Iri-uju ya kpaliri ọhụụ ọzọ, o wee malite ikwa-akwa dị-ilu. O rudatara àlà ọzọ leba anya n’ime ili ahụ, ma hụ ndị mụọ-ozi abụa na eyikwa uwe ọcha. Iru ha n’enwụkwa ọcha. Otu onye na anọdụ àlà n’ebe akwa-isi, onye nke ọzọkwa n’ebe ụkwụ ya, dịka e nyụbere Jisọs. Ha ji nwayọ gwa ya okwu, ma jụakwa ya ihe ọ na akwara akwa. Ọ zaghachiri si, ha e bupuwo onye nwem, a mataghịkwa m ebe ha debere ya. NUA 69.2
Ma dịka ọ tụgharịrị anya site n’ili ahụ, ọ hụrụ Jisọs ka Ọ n’eguzo n’akụkụ ya; kama ọ mataghị ya. Jisọs jiri olu dị nro kwusara Meri okwu, n’ajụ ya ihe kpatara iri-uju ya, wee jụakwa ya onye ọ n’achọ. Ma o chere na ọ bụ onye nlekọta nke ogịge ahụ, wee riọ ya, ọbụrụ na Ọ bupụwo onyenwe ya, ka ọ gwa ya ebe o dotere ya, na ọ g’eburukwa ya. Jisọs jiri olu ya nke eluigwe kwusara ya okwu, si, Meri. Ụda nke olu ihụnanya ahụ a diwo ri mbụ mara ya arụ, na ọ zaghachiri na ngwa-ngwa, Nna m uku! Ma sitekwa n’ọñụ na obi-ụtọ wee chọọ imakụ ya; kama Jisọs làrà azụ, wee si, e metukwala m aka, n’ihi na a karịgokrughi m Nna m; kama jekuru umunne m ma gwa ha, a na m arigokuru Nna m, na Nna unu, na Chineke m, na Chineke unu. Na ọñụ, o wee mee ngwa-ngwa were ozi ọma ahụ jekuru ndị n’eso ụzọ ya. Jisọs mere ngwa-ngwa rigokuru Nna ya inata site n’ọnụ Ya na o nabatawo àjà ahụ, na o mewọkwa ihe niile n’ụzọ dị mma, na inarakwa ike niile dị n’eluigwe, na n’elu ụwà, site n’aka Nna Ya. NUA 71.1
Ndị mụọ-ozi dịka igwe-ojii gbara gburu-gburu Ọkpara Chịneke, wee mee ka ọnụ-ụzọ ebighị-ebi buru ihe e buliri-elu, ka Eze nke ebube bata. A hụrụ m na ọbụna mgbe Jisọs nọ n’etiti ihè ahụ, na ụsụụ ndị eluigwe, n’iru Nna ya na, mgbe ebube nke Chineke gbara ya gburu-gburu, o chefughịkwa ndị n’eso ụzọ ya n’elu ụwà; kama o narawo ike site n’aka Nna ya, ka o wee laghachikute ha, na mgbe o n’anọyere ha ka o wee nyefee ha ike. N’otu ụbọchị ahụ ka Ọ latara, ma gosikwa onwe ya nye ndị n’eso ụzọ ya. O mere ka ha metu ya aka, n’ihi na o lakuruwo Nna ya, o natawọkwari ike. NUA 71.2
Ma n’oge dịka nka, Tomas anọghị n’etiti ha. O jighịkwa obi dị umeàlà nara nkwupụta nke ndị n’eso ụzọ ibe ya; kama o kwesịrị olu ike, werekwa ntukwasi-obi nke onwe-onye kpebie na ya a gaghị e kwenye, m’ọbụghị ma ya g’etinye nkpịrị-aka ya n’oghere ntu ndị ahụ a kụrụ ya, ma tinyekwa aka n’akụkụ ya ebe ube-ọjọọ ahụ mapuru ya. Na nka o zipụtara e nweghị ntukwasi obi n’ebe umunne ya nọ. Ọbụrụkwa na madụ niile g’achọ ihe ngosi dị otua, naanị ole na ole g’anara Jisọs, ma kwerekwa na nbilite-n’ọnwụ ya. Kama ọ bụ ọchịchọ Chineke ka ozi nke ndị n’eso ụzọ ya gazue site n’otu onye rue na onye ọzọ, ma ọtụtụ natara ya site n’ọnụ ndị matara ma nụkwa. Ụdị ekweghị-ekwe nka adịghị Chineke ezi mma. Ma mgbe Jisọs zutere ndị n’eso ụzọ Ya ọzọ, Tomas nọkwa n’etiti ha, n’out-oge ahụ mgbe ọ hụrụ Jisọs o kwenyere. Kama o kwupụtawo na ọ gaghị eju ya afọ ma ọ dịghị ihe ngosi rutere ya aru tụkwasị na nke ya hụrụ anya, Jisọs nyekwara ya ihe ngosi dịka ọ chọro. Tomas tipụrụ mkpu, Onye-nwe m na Chineke m. Ma Jisọs tara Tomas ụta n’ihi ekweghị-ekwe ya. Ọ sịrị ya, Tomas n’ihi na ị hụwo m, ị kwrewọkwa; ngọzi n’adịrị ndị na ahụghị ma kwerekwa. NUA 72.1
Otua, a hụrụ m, na ndị na amataghị banyere ozi nke mụọ-ozi nke mbụ na nke abụa a ghaghị inata ha site n’aka ndị matara, ma sorọkwa ozi ndị ahụ. Dịka a kpọgịdere Jisọs n’obe, otu a ka m hụkwara na a kpọgịdewo ozi ndịa n’obe. Ọzọkwa dịka ndị n’eso ụzọ ya kwupụtara na nzọpụta adịghị n’áhà ọzọ n’okpuru eluigwe, e nyere n’etiti ụmụ madụ, n’otu aka ahụ kwa, ka ndị n’ejere Chineke ozi g’ekwesi ntụkwasị-obi n’atụghị egwu ọbụla kwupụta na ndị nabatara naanị otu akụkụ nke ezi-okwu niile nagịdere n’ozi nke ato aghaghị iji obi-ụtọ nabata nke mbụ, nke abụa na ozi nke atọ dịka Chineke nyeworo ha, m’ọbụ ghara inwe òkè m’ọbụ ọnọdụ ọbụla n’ime okwu a. NUA 73.1
E gosịrị m na ọbụna mgbe ndị inyom nsọ ndịa na ebu ozi ahụ na Jisọs e biliwo n’ọnwụ, ndị-nche agha nke ndị Rom nọkwa na agbasa ozi ụgha ahụ e tinyere n’ọnụ ha site n’aka ndị-isi nchụ-àjà na ndị okenye, n’asi na ndị n’eso ụzọ ya biara n’abali, mgbe ha n’ararụ ụra, wee zuru arụ Jisọs n’ori. Ekwensu e tinyewori okwu ụgha nka n’ime-obi na n’ọnụ ndị-isi nchụ-àjà, nke ndị madụ jikekwara ịnara okwu ha. Kama Chineke e mewo ri okwua ka o wee anya, ma tinyekwa ihe omume dị nkpa, nke ọ bụkwa n’elu ya ka nzipụta n’adabere, buru ihe karịrị isi-agụgọ ọbụla, bụrụkwa ihe n’agaghị ekwe omume ka ndị nchụ-aja na ndị okenye kpuchite ya. Ndị àmà ka e mekwara ka ha bilie site na ndị nwụru-anwụ ikwupụta nbilite n’ọnwụ nke Karaist. NUA 73.2
Jisọs nọgịdere ya na ndị n’eso ụzọ ya ọgụ ụbọchị abụa, nke kpatara ha ọñụ na obi-ụtọ, na ekpughekwara ha n’uju ya bụ ezi-okwu niile nke àlà-eze Chineke. O nyere ha ọlụ ịgbasa àmà nke ihe niile ha hụworo na nke ha nụwọkwara banyere nhuhu-anya ya, ọnwụ ya na nbilite n’ọnwụ ya; na o chụwokwa àjà n’ihi nmehie, ka ndị niile kwere, ga abiakute ya wee nweta ndụ. Ọ gwahere ha ọnụ n’ụzọ dị nro na a g’esogbukwa ha meekwa ka ha daa-mba; kama na ha g’enweta nkasi-obi site n’ikpọrọ akọ-n’uche ha gaa n’ihe ndịa niile ha gabigaworo, na ichetakwa okwu niile nke ya gwaworo ha. Ọ gwara ha na ya emeriwo ọnwụnwa niile nke Ekwensu, ma nọgịdekwa na nmeri n’ime nkpagbu na ahụhụ niile, nke bụ na Ekwensu a gaghị enwekwa ike ọbụla ọzọ n’arụ Ya, kama n’ebe ha nọ ka ọ g’eburu ọnwụnwa ya niile na ike ya biakwasị ha, ọbụna megide ndị niile g’ekwere n’aha Ya. Ọ gwara ha na ha pụrụ imeri, dịka ya onwe ya meriri. Jisọs gbajuru ndị n’eso ụzọ ya nike nke ime ihe iribama, Ọ gwakwara ha na ọ bụ ezie na ndị nmebi-iwu g’enwe ike n’aru ha, na ya g’ezitekwa ndị mụọ-ozi ya noge ụfọdụ ịgbapụta ha; na agaghị a napụ ha ndụ ha ruekwa mgbe ha luzuru ọlụ ha. Ma mgbe ha gbasịrị àmà ha, a g’eji ndụ ha kaa-akara n’elu àmà nke ha gbara. Ndị n’eso ụzọ ya nwere ọnụnụ-ọkụ n’obi jirikwa obi-ụtọ nụrụ ozizi Ya niile. Ha ji oke-nmasị n’eriju afo site n’okwu ọbụla nke dapụtara n’ọnụ Ya dị nsọ. Mgbe ahụ ha matara n’ezie na Ọ bụ ya bụ Onye-nzọpụta nke ụwà. Nkpụrụ okwu ọbụla mikpụrụ-emikpu n’ime-obi ha, ha rikwara uju n’ihi na a g’ekewapụ ha site n’aka Onye-ozizi ha sitere n’eluigwe a goziri-agozi; n’ihi na mgbe nwa-oge gasịrị, ha a gaghịkwa anụrụ okwu nkasi-obi ndịa, jupụtara n’amara nke sitere n’ọnụ Ya. Kama n’ụzọ ọzọ, a kpaliri obi ha n’ihụnanya na oke-ọñụ, mgbe Jisọs gwara ha na Ọ gaje idoziri ha ebe-obibi, na ibia-ọzọ inara ha, ka ha binyere ya mgbe niile. Ọ gwara ha na ya ga ezitere ha Onye nkasi-oibi ahụ, bụ Mụo-nsọ, iduzi, igozi na iduba ha n’ime ezi-okwu niile; O wee welie aka Ya abụa elu ma gọzie ha. NUA 74.1