Ndọndọ Ukuu Ahụ
Isi Nke 7—Nrafu A rafuru Kraist
Mgbe ahụ ka e kuuru m biarue n’oge ahụ mgbe Jisọs riri nri-anyasi ahụ Ya na ndị n’eso ụzọ Ya. Ekwensu e duhiewori Judas, ma dubarakwa ya iche na ya bụ otu n’ime ezi ndị n’eso ụzọ Kraist, kama obi ya nọgịdere n’ọnọdụ nke anụarụ. O hụwọkwa ri ọlụ-ebube dị iche-iche nke Jisọs, o nọyerewọkwa ya n’oge niile ndịa nke ije-ozi ya, ma kwerekwa site nihe niile gosiputara na ọ bụ ya bụ Mesaia ahụ; kama ọ bụ onye anya-uku. Ọ hụrụ ego nanya. O mere mkpesa n’iwe banyere manu-otite ahu dị oke-ọnụ-ahia nke a wuru n’aru Jisọs. Meri hụrụ onye-nwe ya n’anya. Ọ gbaharawo ya nmehie ya niile dị ọtụtụ, ma kpolitekwa nwanne ya nwoke a hụrụ n’ anya nke ukuu site na ndị nwụru-anwụ, na o chetara na ọdịghị ihe dịkarị oke ọnụ-ahia inye Jisọs. Ka manụ ahụ na adịkarị oke ọnụ-ahia ka ọ g’adịrị Meri mma iji gosipụta obi-ekele o nwere n’ebe onye-nzọpụta ya nọ site na inye ya. ma Judas, iji kwachie anya-uku ya, ọ sịrị na a pụrụ ire manụ a were nye ndị ogbenye. Kama Ọ bụghịkwa na ọ nwere nlekụrụ-anya ọbụla n’ebe ndị-ogbenye nọ; n’ihi na o jupụtara na onwe-onye, n’emekwa ihe sọrọ ya site n’akpa-ego nke e nyere ya n’aka ichebe n’ihi inyere ndị ogbenye aka. Judas a dịghịkwa egosi nlekuru-anya ọbụla nihe banyere ọdị-mma na nkpa nke Jisọs, ma ọ neji ihe banyere ndị-ogbenye ahụchi anya omume nke anya-uku ya. Ma omume nka nke Meri mere pụtara n’ezie itụ ya nmehie n’anya megde ndụ anya-uku o nwere. NUA 39.1
Ụzọ ahụ ka e doziri nye ọnwụnwa Ekwensu inweta ezi ọnọdụ n’obi Judas. Ndị Juu kpọrọ Jisọs asị; kma igwe madụ n’ejeso Ya ịnụrụ okwu amamihe site n’ọnụ Ya, na ihụ ọlụ-ebube Ya dị iche-iche. Nka n’akpọpụ akọ-nuche ndị madụ site n’ebe ndị isi nchụ-aja na ndị okenye nọ, n’ihi na ndị madụ n’enwe nmasị dị omimi na inụ-ọkụ n’obi isoro Jisọs, ma nụrụ ndụmọdụ nile nke Onye-ozizi a dị-ebube. Ọtụtụ ndị-isi ọchịchị kwekwara na Jisọs, ma ha n’atụ egwu ikwupụta ya, n’atukwa ụjọ na a g’achụpụ ha na nzukọ. Ndị nchụ-àjà na ndị okenye wee kpebie na a ghaghị ime ihe g’atụgharị uche ndị madụ site n’ebe Jisọs nọ. Ha tụrụ egwu na madụ nile g’ekwere na Ya. Ha ahụghịkwa ọnọdụ udo nke onwe ha. Ha aghaghị itufu ọnọdụ ha dị elu mọbu nye Jisọs n’aka ọnwụ. Ma ọbụna mgbe ha gbusịrị Jisọs, ọdịkwa ndị ọzọ dị ndu bụrụkwa ndị-àmà nke ike ya. Jisọs a kpọtewori Lazarọs site na ndị nwụrụ-anwụ. Ma ha tụrụ egwu na ọbụrụ na ha gbue Jisọs, Lazaros n’onwe ya g’agbakwa àmà ike ebube ya. Ndị madụ na-gbakọ ihụ ya bụ onye a kpọteworo site na ndị nwụrụ-anwụ, ma ndị isi-ọchịchị kpebiri igbukwa Lazarọs ka e wee menyụọ obi ndị madụ. Mgbe ahụ ndị madụ g’echigharikwa isoro omenàlà na ụkpụrụ nke madụ, ikwụ otu-ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ọbụla, bụrụkwa ndị e nwere nhụku sịrị ike n’arụ ha ọzọ. Ha kwekọrọ idọkpụrụ Jisọs mgbe ọ nọdụrụ onwe ya; n’ihi na ọbụrụ na ha g’anwa idọkpụrụ ya site n’etiti igwe madụ mgbe uche ndị madụ nọ narụ ya ha g’atụkwa ha nkume. NUA 40.1
Judas matara ọnụnụ-ọkụ nke obi ha inweta Jisọs, ma kwenye irara Ya nye naka ndị-isi nchụ-aja na ndị okenye n’ihi nkpụrụ ọla-ọcha ole na ole. Ihụ ego n’anya dubara ya ikenye irara Onyenwe ya nye n’aka ndị iro ya. Ekwensu na alụ ọlụ ya site n’aka Judas, ọbụna mgbe nri-anyasi ahụ dị oke mkpa n’aga n’iru, ọ nọkwa n’akpa nkata ịrara Jisọs nye. Jisọs sitere n’obi ilu gwa ndị n’eso ụzọ ya na ha niile ka a g’emehie n’ihi Ya, n’abali ahụ. Ma Pita kwesịrị olu ike ma kwue si na Ọ bụrụkwa na madụ niile pụrụ ibụ ndị e mehiere n’ihi ya, ya onwe ya apụghị ibu. Jisọs wee si Pita, Ekwensu achowo ri inweta gị, ka o wee yọchaa gị dịka oka; ma mu onwe m ekpewo ekpere n’isi gị, ka okwukwe gị ghara ida; ma mgbe e mere ka i chegharia, gị meekwa ka ụmụ-nna gị guzosie ike. NUA 41.1
N’oge ahụ e letara m Jisọs n’ogịge ahụ Ya na ndị n’eso ụzọ ya. N’ọnọdụ iri-uju dị ukuu Ọ gwara ha ka ha chee-nche kpeekwa ekpere ka ha ghara ịba n’ọnwụnwa. Jisọs matara na okwukwe ha g’abụ ihe a nwara, na olile-anya ha g’enwekwa mkpọchụ-iru, na ihe kwesịrị ha g’abụ ike ahụ nke a pụrụ inweta naanị site n’iche nche na ikpesi ekpere ike. Site n’iti mkpu dị ike ma ikwa akwa, Jisọs kpere ekpere, “Nna, ọbụrụ na ọ masịrị Gị, wezuga iko a n’ebe m nọ, ma otu ọdị, Ọ bụghị dịka ọchịchọ m si dị, kama ka e mee ihe Ị n’achọ. Ọkpara Chineke kpere ekpere n’oke ihe mgbu. Ọkpụrụkpu ajịrịja dịka ọbara n’asọpụtakwa Ya n’arụ, n’adasị n’àlà. Ndị mụọ-ozi nọkwa n’erụgharị n’ogịge ahụ, na-hụkwa ọnọdụa, mgbe naanị otu n’ime ha ka e zigara ịgba Ọkpara Chineke ume n’ime ihe mgbu Ya. Ndị mụọ-ozi nke eluigwe tọgbọrọ okpu-eze ha na ụbọ-akwara ha, ma site na nwụte dị mimi n’ele Jisọs. Ọ dịghịkwa ọñụ dị n’eluigwe. Ọ bụ naanị ọchịchọ ha ịgbagịde Ọkpara Chineke gburu-gburu, kama ndị ndu ha gbochiri ha, mọbụghị otua, ka ha nele mge a n’arara ya nye; ha gara anapụta ya, n’ihi na atụmatụ a ka e doziworo rịị nke n’agaghị imezu. NUA 42.1
Mgbe Jisọs kpesịrị ekpere, Ọ biara ile ndị n’eso ụzọ ya. Ha nọ n’araru ura. O nwetaghị nkasi-obi na ekpere ọbụna nke ndị n’eso ụzọ ya n’oge awa ahụ dị oke-egwu. Pita onye jupụtakwara ri na oke inụ-ọkụ nke obi na nwoge gara-aga, nọdụkwara n’oke ura. Jisọs chetaara ya ọnọdụ ya na nkwupụta ya niile, wee si ya, Gịni kwa! Ọ bụ na inweghị ike isoro m chea nche naanị otu awa? Ugboro atọ ka Ọkpara Chineke kpere ekpere na obi mgbu, mgbe Judas, na igwe ndị-agha ya biaruru nso. O jekuru Jisọs dịka ọ n’emekwa mgbe dum ikele Ya ekele. Igwe madụ ahụ gbakwara Jisọs gburu-gburu; kama n’ebe ahụ o gosiputara ike nke O ji bụrụ chi, mgbe ọ sịrị, onye ka unu na achọ? Ọ bụ mu onwe m. Ha niile dàlàra azụ daruekwa àlà. Jisọs jụrụ-ajụjụ nka ka ha hụ ike ya, marakwa na Ọ pụrụ izọpụta onwe Ya site n’aka ha m’ọbụrụ na Ya chọro. NUA 43.1
Ndị n’eso ụzọ ya malitere inwe olileanya mgbe ahụ ha hụrụ ka igwe madụ ahụ dara n’àlà n’adịghị ihe meworo ri eme ha na mma ha na ụta na ubè-arọ ha. Mgbe ha biliri ọzọ n’agbkwa Ọkpara Chineke gburu-gburu, Pita mipụtara mma-agha ya ma bipu ntị otu onye. Jisọs gwara ya ka ọ mịghachi mma-agha ya, ma sịkwa ya, i chere na enwegh m ike ịrịọ Nna m ugbua, na Ọ g’ezitekwara m ugbua ihe karịrị lejiọn ndị mụọ-ozi iri na abụa? A hụrụ m na mgbe ọ n’ekwu okwu ndịa, ndị mụọ-ozi paliri iru ha. Ọ masịrị ha mgbe ahụ, n’ebe ahụkwa, ịgba onye isi ha gburu-gburu, na ichụsasị igwe ndị aghara ahụ. Ma ọzọkwa o wutere ha mgbe Jisọs tinyekwara n’okwu Ya si, kama ole otu ihe e deworo n’akwụkwọ-nsọ g’esi mezue, na otua ka ọ ga adi? Obi ndị n’eso ụzọ Ya dara-mba ọzọ ma nwekwa mkpọchụ-iru nke ukuu, ka ha hụrụ na Jisọs kwere ka ha dọkpụrụ Ya pụa. NUA 43.2
Ndị n’eso ụzọ ya tụrụ ụjo ndụ nke onwe ha, wee gbafusie, onye ọbụla n’ụzọ nke ya, ma Jisọs a bụrụ onye a rapụrụ naanị ya. O, lee ka Ekwensu n’añụrị ọñụ nmeri mgbe ahụ! Ma leekwa ka ndị mụọ-ozi Chineke nọ na nwụte na iri-uju n’oge ahụ. Ọtụtụ nkega dị iche-iche nke ndị mụọ-ozi dị nsọ na onye-ndu ha topụrụ-etọpụ, ka e zipụrụ ilere ọnọdụ ahụ. Ọ bụ ọlụ ha ideda omume ọbụla, nkpari na aruru-àlà nile e mesoro Ọkpara Chineke, na ideda ihe-ufu na nhụju-anya niile nke Jisọs, n’ihi na madụ ndịa g’ahụkwa Ya ọzọ na ndụ. NUA 44.1