Olileanya Dị Ukuu
Onye Iro Nke Nọ Na Nche Mgbe Nile
Onye iro ahụ nke nọ na nche mgbe nile na-ezubata onwe ya n’ezi na ụlọ nile, n’ama nile, n’ime nzukọ, na nzukọ ukwu nke obodo na n’ụlọ ikpe dị iche iche, na-eweta mgbagwoju anya, nghọgbu na nduhie, ma na-ebibikwa mkpụrụ obi na arụ nke ndị ikom, na ndị inyom, na ụmụnta ebe nile. Ọ na-eweta mkposa nke ezi na ụlọ dị iche iche, na-akụnyekwa ịkpọ asị, ọgba aghara, nnupu isi, na igbu mmadụ dịka mkpụrụ. Ụwa wee na-ele ọnọdụ ndị a anya dịka a ga-asị na otu a ka Chineke si chọọ ya, na ha kwesikwara ịdị otu a. Ka ha ra bụ ndị na-enweghị mkpebi siri ike ịbụ ndị na-eso ụzọ Kraịst bụ ndị oru Ekwensu. Mgbe ndị nke Kraịst na-ahọrọ ka ha na ndị na-amaghị Chineke na-ejegharị, ha na-eduba onwe ha n’ọnwụnwa. Ekwensu na-ezopụ onwe ya n’anya ha ma werekwa ihe mkpuchi nke nduhie kpuchie anya ha. OdU 11.3
Ịgbaso omenaala ndị ụwa na-adọta nzukọ Kraịst nye ụwa, o nweghị mgbe ọ na-adọta ụwa nye Kraịst. Iso mmehie na-enwe mkpakọrịta na-eme ka mmehie ghara ịsọ oyi dịka o kwesịrị. Mgbe ọnwụnwa ma ọ bụ ule siri ike bịakwasịrị anyị n’ụzọ nke ije ozi anyị, mgbe ahụ ka o doro anya na Chineke na-ekpuchita anyị, ma ọ bụrụ na anyị ewere onwe anyị weba n’ime ọnwụnwa, anyị gaada mgbe na-adịghị anya. OdU 12.1
Onye ọnwụnwa ahụ na-ejikarị ndị ahụ bụ ndị a na-echeghị na ha nọ n’okpuru ya nụzọ ọ bụla. Onyinye akara aka mmadụ na omume-owere-ahụ ndị mmadụ bụcha ihe ndị Chineke nyere; ma ọ bụrụ na ihe ndị a emee ka mmadụ si n’ebe Chineke nọ pụa, ha aghọwọ ọnya. Ọtụtụ dị, ndị nwere akọ-na-uche a zụrụ nke ọma, ma nwekwa omume mara mma, ma ha bụ ngwa ọlụ añụchara añụcha n’aka Ekwensu. OdU 12.2
Echefula ịdọ aka na ntị ahụ nke akwụkwo nsọ nke nọjerịị na-ada site n’ọgbọ ndị gara aga ma na-erutekwa anyị taa: “Nweenụ anya udo, na-echenụ nche; onye ahụ nke na-ekuru unu gaa ikpe bụ Ekwensu; dị ka ọdụm na-agbọ ụja, ọ na-ejegharị, naachọ onye ọ ga-elomi”. “Yikwasịnụ ihe agha nile nke Chineke, ka unu we pụụ iguzogide ihe nile Ekwensu na-ezupụta” (1 Pita 5:8; Ndị Efesọs 6:11). Onye iro uku anyị na-ejikere n’ihi ọgụ ikpeazụ ya. Ka ha ra bụ ndị na-eso Jisọs ka onye iro a ga-aluso ọgụ. Mgbe ọ bụla onye nke Kraịst na-agbaso ụzọ Chineke karịị, mgbe ahụ ka ọ na-apụta ihe karịị ịbụrụ onye Ekwensu na-ebuso agha. OdU 12.3
Ekwensu ji ọnwunwa ọkụ na nke aghụghọ dị iche iche zute Kraịst n’ụzọ nile; ma achụghachiri ya azụ n’ọgụ nile. Mmeri ndị ahụ na-eme ka ọ dị ire anyị onwe anyị inwe mmeri. Nye ndị nile ndị na-achọ inweta ike, Kraịst ga-enye ha ike. Ọ dịghị onye ọ bụla Ekwensu pụrụ imeri ma ọ bụrụ na o kwenyeghị ka e merie ya. Onye ọnwụnwa enweghị ike ọ bụla ịñagharị akọ na uche ma ọ bụ iji aka dị ike mee ka mkpụrụ obi mee mmehie. O nwere ike iweta nhuju anya, ma ọ bụghị mmerụ. Mmeri ahụ nke Kraịst meriri kwesiri inye ndị na-eso ụzọ Ya agbamume nke obi ike iji lụa ọgụ megide mmehie na Ekwensu. OdU 13.1