Olileanya Dị Ukuu
Adam Abụa Zutere
Dịka a na-akpọbata ndị agbapụtara n’ime obodo nke Chineke, oke iti mkpu ọñụ dara n’ihi Adam abụọ na-akwado izute onwe ha. Ọkpara Chineke ga-anabata nna nke ọgbọ anyị bụ onye o kererịị, bụrụkwa onye mmehie ya mere ka akpọgide Onye nwe anyị n’obe. Dika Adam chọpụtara apa ntu Ya, o we daa n’ụkwụ Kraịst. Onye nzọpụta kuliri ya we sị ya ka o le ogige Iden ebe o siworo ọtụtụ oge gara aga pụa. OdU 95.3
Ndụ Adam jupụtara na mwute. Akwụkwọ osisi ọ bụla nke na-akpọnwụ, na ihe ọ bụla e jiri chụọ aja, na ihe niile na-eme ka mmadụ ghara ịdị ọcha, na-echetara ya mmehie ya. OdU 96.1
Ọ na-ewute ya nke uku dịka ọ na-ahụ onwe ya ka onye wetara mmehie. N’ezie, o nwewo ezi nchegharị na mmehie ya, ma nwụọ nwe olile anya nbilite n’ọnwụ. Ma ugbu a, site n’ịchụ aja nke mmehie, eweghachiri Adam n’ọnọdụ ya. OdU 96.2
O ji ọñụ hụ osisi ndị ahụ na-adị ya mma, bụ nke ọ na-atatụ mkpụrụ ha mgbe o nwebeghị mmehie o mere. Ya we hụ osisi vine o ji aka ya we na-elekọta, na okoko osisi ndị n’amasị ya ilekọta. Nke a bụ Iden eweghachiri. OdU 96.3
Onye nzọpụta duuru ya rue osisi nke ndụ me kwa ka o rie ya. Ya we hụ ọtụtụ ezi na ụlọ ya ndị agbapụtara. Mgbe ahụ o wepụtara okpu ya tụkwasị n’ụkwụ Jisọs ma makụọ Onye Nzọpụta. Ya we were une na ihe egwu ndị ọzọ dị n’eligwe bụa abụ mmeri. “O kwesiri bụ Nwa Atụrụ ahụ nke egbuworo egbu” Nkpughe 5:12. Ezi na ụlọ Adam tụkwasiri okpu ha n’ụkwụ Onye Nzọpụta dịka ha na-ehuru ala ịsọpụrụ Ya. Ndị mọ ozi riri uju n’ihi ọdịda Adam mesiri ñụrịa ọñụ mgbe Jisọs meghere ili ndị niile kwere n’aha Ya. Mgbe ha hụrụ ọlụ nke nzọpụta, ha ji otu olu we bụa abụ. OdU 96.4
N’elu “osimiri e ji enyo me nke agwakọtara n’ọkụ”, ahụkwara ndị na-apụta n’aka nwa anụ ọhịa ahụ na mmeri, ya na n’aka ihe oyiyi ya, na n’aka ọnụ ọgụgụ aha ya. Ọgụ nnụ iri na ọgụ nnụ asatọ ahụ ndị agbatararịị n’ụwa, ha we “na-abụ abụ ọhụụ nke Mosis na nke Nwa Atụrụ Ahụ”Nkpughe 15:2,3. Nanị ọgụ nnụ iri na ọgụ nnụ asatọ ahụ maara abụ ahụ, n’ihi ọ bụ abụ na-echetara ha ihe niile ha gabigara. “Ndị a bụ ndị na-eso Nwa Atụrụ ahụ ebe ọ bụla ọ na-eje”. Ndị a ka agbapụtara n’etiti mmadụ “ịbụrụ Chineke na Nwa Atụrụ ahụ mkpụrụ mbụ”Nkpughe 14:4,5. Ndị a bụ ndị si n’oke nkpagbu ahụ pụta nke ahụbeghị n’obodo ọ bụla, ha nagidere ihe mgbu dịka mgbe Jekọb nwere nsogbu, ha nọ na-enweghị onye ogbugbo rue mgbe Chineke ga-ekpe ikpe ikpeazụ Ya. Ha “sakwara uwe mwụda ha, mekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ”. Ọ dịghịkwa ụgha ọ bụla a hụrụ n’onụ ha: ha bụ ndị a na-ataghị ụta” n’iru Chineke. “Agụụ agaghị agụ ha ọzọ, akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ ọzọ, anyanwụ agaghị achakwa ọzọ ma ọ bụ okpom ọkụ ọ bụla n’ihi na Nwa Atụrụ nke nọ n’etiti oche eze ahụ ga-azụ ha dịka atụrụ, ọ ga-edurukwa ha gaa n’isi iyi nke mmiri nke ndụ. Chineke ga-ehichapụ kwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha”. Nkpughe 7:14; 14;5; 7:16, 17. OdU 96.5