Olileanya Dị Ukuu
Okwukwe Nke Na-Anọgide Anọgide
Oge ọlụlọ mmiri na ntaramahụhụ nke chere anyị n’iru gaachọsike ike okwukwe nke pụrụ ịnagide ike ọgwụgwụ, ịtụ nchịnchị na agụrụ nri; bụ okwukwe nke na-apụghị ịda mba, ọ bụ ezie na anwara ya nke uku. Mmeri nke Jekọb meriri bụ ihe ama nye ikike na ịdị mkpa nke ekpere. Ndị nile ga-ejigidesi nkwa nile Chineke aka ike, dịka Jekọb, ga-emeri dịka o meriri. Ịgba mgba nke metụtara madụ na Chineke - ọ bụ nanị madụ ole na ole matara ihe ọ pụtara! Na mgbe anya mmiri na obi dara mba na-eru ka osimiri megide onye na-arịọ arịrịọ nke ekpere, ọ bụ nanị madụ ole na ole na-ejigidesi nkwa nile Chineke aka ike. OdU 85.3
Ihe anya hụrụ, ndị dị egwu, dị ụjọ, ga-apụta ihe n’oge naadịghị anya n’iru cluigwe, bụ ihe ndị na-egosipụta ihe ịrịbama nke ije ozi nke ndị mọ ọjọọ. Ndị mọ ọjọọ ga-ejekwuru “ndị eze nke ụwa” na ndị ụwa nile, ịrụgide ha ijikọta aka ha na Setan n’ime ịgba mgba nke ikpeazụ ya imegide ọohịchọ Chineke. O nwere ndị ga-ebilite ma kwupụta na ha bụ Kraịst na onwe Ya. Ha ga-eme ihe ịrịbama nke ịgwọ ọrịa ma kwue na ha nwere nkpughe nke sitere na eluigwe bụ ndị na-emegide ama nke Akwụkwọ nsọ. OdU 86.1