Olileanya Dị Ukuu
Isiokwu 5—Isi Nke Ise Olile-Anya Ụgha
Ụkpụrụ-ozizi nke ọdịdị anwụghi-anwụ, nke e nwetara na mbụ site n’echiche ndị nēkpere arụsị na nke dịkwaara n’itiri nke ozizi ụgha e webatara n’ime okwukwe nke ndị Kristen, egbụdawo nke bụ ezi-okwu na “ndị nwụrụ-anwụ a dịghị ama ihe ọbụla” Eklesiastis 9:5. Imerime ụmụ-madụ kwenyere na mụọ nke ndị nwụrụ-anwụ bụ “mụo ndị nēfe-ofufe e zipụrụ ije ozi nihi ndị gaje iketa nzọpụta” Ndị Hibru 1:14. OdU 41.1
Okwukwe ahụ nke e kwere na mụọ nke ndị nwụrụ-anwụ nālọghachi ijere ndị dị ndụ ozi e doziwokwa ụzo nye ofufe mụoọjọ ọlọrọ-ọhụ. Ọ bụrụ na ndi nwụrụ-anwụ nwere uru nke inwe amamihe dị elu karị nke ha nweworo na mbụ, gịnị mekwara ha adịghị alọghachi n’ụwa ma ziekwa ndị dị ndụ ihe? Ọ bụrụkwa na mụọ nke ndị nwụrụ-anwụ na erugharị gbụru-gbụru ndị enyi ha n’ụwa, gịnị mere ha adịghị ekwusara ha okwu? Ole otu ndị kwenyere na mkpuru-obi madụ nādị ndụ mgbe madụ nwụsịrị gēsi jụ ịnara “ìhè nke Chineke” e zitere site n’aka ndị mụọ dị ebube? Nkaa bụkwa ụzọ e chere na ọ dị-nsọ nke bụkwa ụzọ Ekwensu ji alụ-ọlụ. Ndị mụọ-ozi dara-ada nāpụta n’ọdịdị ndị-ozi sitere n’ala ndị mụọ. OdU 41.2
Eze nke ajọ-omume nwere ike nke ịkpọpụta n’iru ụmụ-madụ oyiyi nke ndị enyi ha nwụrụ-anwụ. Òyìrì ahụ bụkwa ezigbo ya n’ozuzu-oke, nke e mepụtara n’ụzọ nāgaghị esi-agụgọ. Ọtụtụ ndị ka a kasiworo obi n’ụzọ juru afọ na ndị ha hụrụ nanya nwụrụanwụ nọ na ndụ-añụrị n’elu-igwe. N’eletaghị ihe-aghọm ọbụla, ha nēnye ntị ha ịnụrụ “ndị mụọ nēduhie eduhie, na ozizi ụkpụrụ nke ndị mụo-ọjọ.” ITimoti 4:1. OdU 41.3
Ndị nile bara n’ala-ili nēmeghị njikere ọbụla nāsị na ha nọ n’obi-ụtọ ma nọrọkwa n’ọnọdụ dị elu n’elu-igwe. Ndị mere dịka ha si n’ala mụọ nābia nleta, mgbe ụfọdụ nēnyekwa ndụmọdụ na okwu ịdọ-aka na ntị nke nēmezukwa dịka ezi-okwu, Mgbe ahụ, dịka e lekwasịrị anya na nkaa, ha n’ewepụtakwa ozizị ndị gāgbarụ ihe e deworo n’akwukwọ-nsọ. Nihi na ha nēkwukwa ụfọdụ eziokwu, ma mgbe ụfọdụ kwupụtakwa ihe ndị gēme n’odị-niru wee sị otua nēgosị ọdịdị nke kwesịrị ntụkwasi-obi, ya mere ozizi ụgha ha wee bụrụ nke a nānabata. Iwu Chineke ka a nēwezugakwa n’ọnọdụ ya, ọbụna Mụọ nke amara ka a nēmekwa ihe efu. Ndị mụọ ndia nāgọnarịkwa Kraist ịbụ Chi ma debekwa Onye-okike ahụ n’ogo nke ha onwe ha. OdU 41.4
Ọbụ ezie na nlụpụta nke aghụghọ ndị nēti-òkwé ka a nākpọ wayo, kama ọ dịwokwa ọtụtụ ihe ngosị ndị were anya na ha sitere n’ike dị elu karị nke madụ, nke bụkwa ọlụ-aka nke ndị mụo-ọjọ. Ọtụtụ kwenyere na ofufe mụo-ọjọ bụ naanị wayo. Ma mgbe a kpọtara ha iru-na-iru nụdị ihe ngosi pụtara ìhè nke ha n’apụghị ịgọnarị karịkwa ikwenye na ọ bụ ike nke karịrị nke madu ha gābụ ndị e duhiere ma narakwa ha dịka ike uku nke Chineke. OdU 42.1
Site n’inye-aka nke Ekwensu, ndị mgba-nsi nke Fero meputakwara ihe oyiri-ọlụ nke Chineke. Lee Ọpụpụ 7:10-12. Pol nāgba-ama sị na ọbịbia nke Onyenwe-anyị gādị naanị mgbe o mezuru bụ “ilụsi-ọlụ ike nke Setan n’ike nile ọbụla na ihe iribama di iche iche na ọlụ-ebụbe di iche iche nke ụgha na aghụghọ nilekwa nke ajo-omume” Ndị 2Tesalọnika 2:9, 10. Ma Jọn nēkwukwa sị “Ọ nēmekwa oke ihe iribama dị iche iche, ọbụna ime ka ọkụ si n’elu-igwe rịdata n’ụwa n’iru anya madụ nile, o wee nēduhie ndị bi n’elu-ụwa site n’ihe iribama ndịa nile nke o nwere ikike ime.” Nkpughe 13:13, 14. Ọ bụghị omume nrụrụ-aka wayo ka a nēkwu okwu ya n’ebea na ọ gēme. Ụmụ-madụ ka a nēduhie site nihe iribama dị iche iche nke ndị-ozi nke Ekwensu nēme, ọ bụghị nke wayo. OdU 42.2