Olileanya Dị Ukuu
Ọgbụgba Ama Zuru Oke
Chineke agbaala ama zuru oke n’ime okwu Ya, na okwu Ya bu ihe nke ime mmụọ sitere n’ebe Ya onwe Ya nọ bịa. Ma uche mmadụ, bụ nke nwere nsọtụ, apụghị apụghị ịghọta n’ozuzu oke ihe ndị bụ nzube nke Onye ahụ na-enweghị nsọtụ. “Lee otu a na-enweghị ike ịchọpụta ikpe ya niile, otu a na-enweghịkwa ike ịtụpụta ụzọ ya niile” (Ndị Rom 11:33). Ma na-agụghị nke a, anyị pụrụ ịchọpụta ịhụnaya nke na-enweghị oke na ebere nke ejikọtara ha na ike na-enweghị nsọtụ. Nna anyị nke eluigwe ga-ekpughere anyị naanị ihe ndị dị maka ọdịmma anyị ịmata; a gafee nke a, anyị ga-adabere n’Aka ahụ nke pụrụ ime ihe niile, n’Obi ahụ nke jupụtara n’ịhụnanya. OdU 25.3
Chineke agaghị ewepụta ihe niile a pụrụ iche n’iru dịka ihe kpatara ekweghị ekwe. Ka ha ra bụ ndị naachọ nko ebe ha gaekonye obi abụa, ha dum ga-achọta ha. Ndị ahụ bụkwa ndị naagaghị ege ntị ruekwa mgbe e wepụchasịrị n’ụzọ ha ihe niile naeweghị ha anya, agaghị abịakute ihè ahụ. Obi ahụ nke a naemeghị ka ọ dị ọhụụ, ya na Chineke dị n’iro. Ma okwukwe ka Mọ Nsọ na-akpali, ọ ga na-etokwa ka a na-echebe ya n’ịhụnanya. Ọ dịghị onye ọbụla nke pụrụ ịdị ike n’okwukwe ma ọ bụrụ na o nweghị mgbalị nke sitere na mkpebi siri ike. Ọ bụrụ na ndị mmadụ ewere onwe ha nye na ndụ nke ntamu, obi abụa ha ga-esi ike karịa. OdU 26.1
Ma ndị ahụ ndị na-enweghị ntụkwasị obi ma nweekwa obi abụa n’ebe nkwa nke amara Ya dị, enweghị nkwanye ugwu ọbụla nye Kraịst. Ha bụ osisi na-adịghị amị mkpụrụ, nke na-egbochi ihe anyanwụ irute osisi nta ndị ọzọ, na-eme ka ha kpọnwụa ma nwụakwa n’okpuru oke ọjụjụ oyi nke onyinyo ya. Ọlụ nke ndị dị otu a lụrụ na ndụ ha ga-apụta ihe bụrụ ama nke na-adịghị agwụ agwụ megide ha. OdU 26.2
Ọ dị naanị otu ụzọ nke ndị ahụ na-aghaghị ịgbaso, bụ ndị na-achọ n’ezie ka ha nwere onwe ha pụa n’obi abụa. Kama ajụjụ ntamu na ihe ahụ nke ha na-aghọtaghị, ka ha ñaa ntị nye ihè ahụ nke na-adịwoori mbu na-amụkwasị ha, ha ga-anata ihè nke karịrị. OdU 26.3
Setan pụrụ igosi ihe yiri eziokwu n’ụzọ dị nnọọ ka ọ bụ eziokwu ka o duhie ndị na-achọ ka e duhie ha, bụ ndị na-achọ ka ha jụ ọchụchụ aja ahụ nke eziokwu chọrọ. Ma ọ bụ ihe a naapụghị ime bụ ya ido n’okpuru ike ya, otu mkpụrụ obi nke naachọsi ike, na-agbanyeghị ihe ọ ga-efu ya, ka ya mara eziokwu. Kraịst bụ eziokwu, “ihè ahụ nke na-enye mmadụ ọbụla nke naabịa n’ime ụwa ihè.” “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ime ihe Ọ naachọ, ọ ga-amara ihe ozizi a bụ” (Jọn 1:9; 7:17). OdU 26.4
Onye Nwe Anyị na-ekwe ka ndị Ya banye n’ihe nwapụta dị ọkụ nke ọnwụnwa; ọ bụghị na ọ na-amasị Ya ka ha hujue anya, kama n’ihi na nke a dị mkpa nye mmeri ikpeazụ ha. Ọ gaghị eji ebube Ya na-ekpuchi ha mgbe niile pụa n’aka ọnwụnwa n’ihi na ihe nlụpụta nke nwale ahụ bụ ijikere ha iguzogide agụụ ihe ọjọọ niile. Ọbụna ndị ajọ mmadu na ndi mmụọ ọjọọ apụghị igbochi iru Chineke n’ebe ụmụ Ya di ma ọ bụrụ na ha ga-ekwupụta ma wezuga mmehie ha, ma kụrụkwa nkwa ya niile. Ọnwụnwa niile, nke zoro ezo, na nke pụtara ihe ka a pụrụ imeri nke ọma, “ọ bụghị site n’ike, ọ bụghị site n’ụsụ ndị agha, kama site na Mmụọ m, ka Jehova nke ụsụ ndị agha sịrị” (Zekarịa 4:6). OdU 27.1
“Onye bụkwa onye ahụ nke na-emejọ unu, ma ọ bụrụ na unu ghọrọ ndị na-anụ ọkụ n’obi n’iso ezi ihe? (1 Pita 3:13). Ekwensu maara nke ọma na mkpụrụ obi ahụ nke kachasị adịghị ike, ma ọ na-anọgide n’ime Kraịst, karịrị akarị iguzogide ụsụụ ndị agha niile nke ọchịchịrị. N’ihi nke a, ka a na-achọ ime ka ndị agha nke obe si na ebe ha ewusiri ike pụta, ka ya onwe ya na-eche anwụ, na-ejikere ibibi onye ọbụla ga-azọbata ụkwụ n’ebe ọ nọ. Ọ bụ naanị n’ịdabere na Chineke, na ige iwu Ya ntị ka anyị pụrụ inwe nchekwa. OdU 27.2
Ọ dịghị onye ọ bụla nke nweere onwe ya pụa n’ịla n’iyi ma ọ bụrụ na ọ nọgideghị n’ekpere. Rịọ Onye Nwe Anyị arịrịọ n’ihi amamihe nke e ji aghọta okwu Ya. Setan bụ ọkachamara n’ikwugharị okwu nke Akwụkwọ Nsọ, na-edota nkọwa nke ya onwe ya n’ama okwu dị iche iche ndị o bu n’obi iji mee ka anyị sụọ ngọngọ. Anyị kwesiri iji obi dị ume ala mụọ Akwụkwọ Nsọ. Ka anyị na-anọ na nche mgbe niile megide nchepụta niile nke Ekwensu, anyị kwesiri ikpe ekpere mgbe niile, na-asị: “Edubala anyị n’ime ọnwụnwa” (Matiu 6:13). OdU 27.3